Ihe Ụmụada Ngwo mere nwaanyị pịara nne ya bụ agadị ihe

Ebe foto si, Screen Grab

Dịka ihe onyonyo na-efegharị na Soshal Midia nke gosiri ebe otu nwaanyị na-apịa agadị nwaanyị ihe.

Akụkọ na-ekwu na ya bụ ihe mere na Ngwo, Enugwu Steeti.

Ihe onyonyo ọzọ kwa na-egosi ebe ụmụ nwaanyị gara njem n'otu ụlo ebe ha sị ya bụ ihe mere, úmụnwaanyị a kpọro onwe ha "Ụmụada Ngwo".

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Mgbe nwaanyị ahụ rịọrọ nne ya mgbaghara

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Ụmụada sọkwa rịọ ya mgbaghara

Ihe onyonyo a gosiri ebe akpọpụtara otu nwaanyị onye ha sị bụ nwaanyị egosiri n'ihe onyonyo na-eti agadi nwaanyị a sị bụ nne ya ihe.

Ya bụ nwaanyị gburu ikpere n'ala were rịọ agadị nwaanyị a mgbaghara.

Ụmụ nwaanyị ndị a kpọro onwe ha Ụmụada n'ihe onyonyo a soro rịọkwa agadị nwaanyị ahụ mgbaghara.

BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Enugwụ steeti bụ Daniel Ndukwe n'ekwe ntị ya maka ihe onyonyo ndị a na-efegharị kama ọ zaghị, e zịgakwara ya ozi n'ekwe ntị ya mana ọ zabeghị.