Gịnị mere ndị dọkịta jiri chọọ ịgba abụbụọrụ gburugburu Naịjirịa?

Gịnị mere ndị dọkịta jiri chọọ ịgba abụbụọrụ gburugburu Naịjirịa?

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu jiktara ndị dọkịta bi n'ụlọọgwụ na Naịjirịa bụ Nigerian Association of Resident Doctors (NARD) ekwuola na ha ga-amalite ịgba abụbụọrụ gburugburu Naịjirịa.

Dịka otu NARD siri kwuo, abụbụọrụ ahụ a na-amaghị mgbe ọ ga-akwụsị ga-amalite ma ọ kụọ elekere iri na abụọ nke etiti abalị n'ụbọchị Tuzde 7 Eprel 2026.

NARD kwuru na abụbụọrụ a bụ maka mkpebi Gọọmenti Etiti ịkwụsịtụ mmejupụta usoro ego mkponyeaka a hazigharịrị ahazigharị bụ Professional Allowance Table, nke bụ otu n'ime ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ ha kwekọrịtara oge ndị otu ahụ gbachara abụbụọrụ n'afọ 2025.

Otu jikọtara ndị dọkịta bi n'ụlọọgwụ nwere mkpebi a oge ndị isi ha nwechara nzukọ pụrụiche n'ụbọchị Satọde 4 Eprel 2026.

A tụrụ anya na abụbụọrụ a ga-akụsasị ọrụ nlekọta ahụike gburugburu Naịjirịa.

N'ozi ha wepụtara, nke Onyeisi ha bụ Dr. Shuaibu Ibrahim binyere aka na ya, ndị otu NARD kọwara ọnọdụ a dịka nke na-ekwesịghị ekwesị.

Ha tara Gọọmenti Etiti ụta maka ịmanye ndị dọkịta ịmalite abụbụọrụ ọzọ gburugburu Naịjirịa.

Dr. Ibrahim kwuru na nsogbu a sitere n'imejupụta usoro ego mkponyeaka a hazigharịrị ahazigharị bụ Professional Allowance Table, nke NARD na Gọọmenti Etiti kpara maka ya oge ha gbachara abụbụọrụ were ogologo oge n'afọ 2025.

Nkwekọrịta ha nwere oge ahụ gụnyere ibuli ụgwọọnwa ndị dọkịta bi n'ụlọọgwụ, nke metụtara ego mkponyeaka maka ọrụ, oge ọrụ, ịrụ ọrụ n'ime ime obodo nakwa ụgwọ ọrụ ndị a na-arụghị n'ụlọọgwụ.

Dr. Ibrahim kwuru na ọ bụ eziokwu na ha kwetara ịmalite mmejupụta nkwekọrịta ahụ n'ọnwa Jenụwarị 2026, mana e bugaziri ya n'ọnwa Febụwarị n'ihi ụfọdụ ihe ndọghachiazụ.

Ka ọ dị, NARD na-ebo ebubo na gọọmenti chọziri ịkwụsị atụmatụ ahụ n'ọnwa Eprel, bụ nke ha kwuru na na-akụnye ụkwụ na ntụkwasịobi, ma bụrụkwa nke megidere nkwekọrịta ndị ha nwere n'oge gara aga.

N'ihi nke a, ndị dọkịta bi n'ụlọọgwụ na-akpọ oku ka gọọmenti jiri ọsọ na ije tụgharịa mkpebi ahụ, ma kwụchapụ ha ụgwọ niile e jikọrọ ha.