Angela Nwosu kwuru ihe ise a ga-atụ gị n'anya
Onye ama ama na-eme ihe onyonyo maka aramara bụ Angela Nwosu na BBCIgbo nwere mkparịta ụka ebe o kwuru ọtụtụ ihe ndị mmadụ amaghị maka ihe ọ na-eme.
Lee ya n'uju ebe a
Kama ọ bụrụ na ị chọrọ ya na nkenke, lee ihe ise gbara ọkpụrụkpụ o kwuru:
1) Ụfọdụ ndị Pastor, ndị isi ndị agha na ndị ọgaranya ụfọdụ na-agba ya aka ahịa nke ọma, O kwuru sị "ndị isi ụka na-abịa achọta m maka enyem aka, ha mechaa ha na-ekpere m ekpere".
O kọwara na ọnweghị ihe na-esere ya na ndi ụka.
O kwuru sị "Ọ bụrụ na mụọ gi anabataghị ihe m na-eme, biko a zụla.
2) O kwenyere n'ikikere si n'ala, mmiri na ikuku.
O kwenyere na ha na-ebute ihe ọma
Ọ mara atụ sị na ụfọdụ ndị na-eji ụkwụ ha gaharịa n'obodo ha batara ọhụru ma jiri ọnụ ha kwa ala ahụ ihe ha chọrọ.
3) Angela Nwosu kwenyere na ọ bụghị okwu ọjọọ maọbụ ịkwa mmadụ emu ka mmadụ ga-eji ewebata ihe ọma na ndụ ya.
4) O kwuru na ọ kwụsịri ịga ụlo ụka n'ihe dịka afọ 2015/2016.
Ọ kọwara na ọ bụghị na enwere ihe ọjọọ ọ hụru kama na ọ bụ na omasịghị ya.
5) Nwosu kwuru na-agbanyeghị na Nne ya na ụmụnne ya akwadoghi ihe ọ na-eme, na ha na-ekpere ya ekpere.
O kwukwara na dị ya kwadoro ihe ọ na-eme.
Na mmechi, ọ gwara ndị mmadụ ka ha hapụ iji obi ọjọọ eso soshal Midịa, kama mgbe mmadụ hụru ihe ọma ka onye ahụ kelee Chineke ma kpee ekpere ka onweta nke ya.
Isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available