Coronavirus: Lee etu ụfọdụ ụzọ dị na Briten na Jamani ka mmachi ngaghari malitere

Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị mmadụ na-erubere mmachị gọọmentị Briten machịrị isi

Mba ụwa niile na-agba mbo ịhụ na ọrịa Coronavirus bịara na njedebe, ọtụtụ n'ime mba ụwa ehiwela mmachị ngagharị iji chekwa ndụ ndị obodo ha.

Ndị Naijirịa bị na mba Briten na Jamanị zitere anyị etu mmachị sị emetụta ha.

Mba Briten

Nwaafọ Naijirịa bị na Briten na-akọwa na dịka ọrụ ya bụ inya ụgbọ oloko na ya na-aga ọrụ ị hụ na ndị ọrụ gbata gbata ruru ụlọ ọrụ ha.

Onye ọzọ kwa bụ onye nkụzị na mahadụm na mba Briten kwukwara na ọmetụtaghị ya dịka ọ bụ na Ịntanetị ka o ji akụzịrị ụmụakwụkwo ya ihe kamgbe.

Lee ihe ha zitere anyị -

Nkọwa foto, Otụtụ ndị mmadụ nọ n'ime ụlo ha dị na 'East London'
Nkọwa foto, Ụgbọala nọ n'ụzọ pere mpe
Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị mmadụ na-erubere mmachị gọọmentị Briten machịrị isi
Nkọwa foto, Ụgbọala na-agba okporo ụzọ nke 'South London' ebughị ibu

Na Jamani

Na mba Jamanị, ndị mmadụ na-akwado mmachi gọọmentị ga-eme.

Otu nwaafọ Naijirịa bị na Jamanị sị na enweghị ọtụtụ ndị mmadụ n'okporo ụzọ.

Ụgbọala nọ n'ụzọ pere mpe ma ndị nchekwa na-agagharị ịhụ na ndị mmadụ rubere mmachị gọọmentị isi.

Dịka ndị mmadụ ji egwu azụcha ihe niile dị n'ahịa, ndị na-ere ahịa enweela opekete mpe ihe mmadụ ga-azụ mgbe ha biara ahịa.

Lee ka o sị aga na mba Jamanị

Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-eche ka ha zụta ihe n'ahịa kamgbe 6:30 ụtụtụ
Nkọwa foto, Lee ka ebe a na-edowe ngwa ahịa ka ọ sị tọgbọ
Nkọwa foto, Ụgbọ oloko tọgbọ chakọọ n'ụfọdụ ebe na mba Jamanị
Nkọwa foto, Ndị mmadụ azụchaala ihe dị n'ahịa