Balogun Market Fire: Ụlọahịa abụọ adala n'ihi ọkụ n'agba na Balogun
Ọnụ na-ekwuru ndị orụ gbatagbata na Legọs bụ Nosa Okunbor gwara BBC na ụlọahịa abụọ adala n'ihi ọkụ gbara n'Anambra Plaza dị na Balogun na Legọs.
Anya hụrụ ka o si mee sị na ọkụ a malitere mgbe o ji ọkara gafee elekere itoolu nke ụtụtụ a.
Ọkụ a butere ọgbaghara n'ahịa Balogun ebe ndị mmadụ na-agbalị ịzọpụta ngwaahịa ha.
Onyeisi ndị ọrụ gbatagbata bụ Lasema Oluwafemi Oke-Osanyitolu sị na Amabeghị ihe butere ọkụ a kama na onwereike ịbụ ọnọdụ ihueluigwe.
Ebe foto si, Twitter/@Gboyegakosile
Ọ sị na ndị ọrụ ya nakwa ndị ọrụ mgbanyụọkụ na-agba mbọ imenyụ ọkụ ahụ ma rịọ ka onye ọbụla dere duu.
Cheta na nke a ga-eme ya ugboro abụọ n'ime ọnwa atọ ọkụ na-agba na Balogun dị na Legọs Island.
Kirie ihe a ka ị chọpụta ụlọọrụ ndị mgbanyụ ọkụ dị nso n'ebe ị nọ.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available