Ncheta Ọbịbịa Eri: Mmemme a ebirila ọkụ n'Aguleri ugbua

Nkọwa foto, Eze Chukwuemeka Eri

Taa ka ndị obodo Aguleri na eme emume ncheta ọbịbịa Eri.

Nke a bụ nnukwu emume, ọbụghị sọ n'Aguleri kama n'ala Igbo niile gbaa gburubguru.

Dịka akụkọ sị kọọ, Eri bụ nna ndị Igbo niile.

N'ihi nke a ka ndị Igbo niile ji akwanyere emume ncheta ọbịbịa Eri nnukwu ugwu.

BBC Igbo kwụ chịm na ya bụ emume wee na-ewetara gị etu ihe niile sị aga.

Lee ya na foto ndịa:

Nkọwa foto, Ihe ọkpụkpụ na-egosi Eri onye ụfọdụ sị na ọbụ ya bụ nna ndị Igbo niile
Nkọwa foto, Ndị eze si ebe dị icheiche n'ala Igbo gbara ụkwụ n'Aguleri taa
Nkọwa foto, Igwe Nnaeme Achebe, Obi nke Ọnịcha nọkwa ebe ahụ, ya na onye enyemaka ya
Nkọwa foto, Onye na-anọchite anya Ooni nke Ife dị n'ala Yoroba
Nkọwa foto, Ndi ichie ndị Aguleri nọkwa ya n'ozuzu oke
Nkọwa foto, Anaghị achọ ụmụnwanyị achọ
Nkọwa foto, Ọtụtụ ụmụnwanyị isi ojii mba Amerịka bịakwara ya bụ emume

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ihe dị iche n'etiti akpụ Ghana na nke Nigeria