Natural Resources: Imo State na ihe akụ ọnatarachi juputara n'ime ya
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Imo steeti so na steeti na-emepụta mmanụ agbịdị na Naịjirịa.
Ụmị mmanụ agbịdị dị n'Imo steeti karịrị otu narị na iri isii.
Ụmị ndị dị n'obodo iri na abụọ na steeti ahụ
Mana ọ bụghị naanị mmanụ agbidi bụ ihe akụ ọnatarachi dị na steeti ahụ.
Lee ndị ọzọ ebe a dịka nchọpụta ngalaba 'Raw Materials Research & Development Council' si kwuo.
1) Zinc
Ebe foto si, www.worldatlas.com
Zinc bụ ụdị igwe e si n'ala egwupụta.
Chaịna, Peru nakwa Ọstrelia bụ mba ndị e ji mmepụta 'zinc' mara.
Ọ na-enye aka na mmepụta ọkụ latrik.
A gwakọọ 'zinc' na 'copper', e nweta 'brass'.
E nwekwara 'zinc' nke na-edozi ahụ.
Ihe ndị ọọ e ji 'zinc' emepụta bụ rọba, mmanụ e ji ete ụlọ (paint), na kemịkalụ ụfọdụ.
Na mpaghara ụfọdụ n'Okigwe na Orlu ka e nwere 'zinc' n'uju.
2) Gypsum
Ebe foto si, Getty Images
Gypsum bụ ụdị nkume e si n'ala egwupụta.
Ihe e ji ya arụpụta gụnyere nzu bekee a kpọrọ 'chalk', ọgwụ, nakwa 'Plaster of Paris' (POP).
E jikwa ya eme ka ala kawanye mma iji kọọ ihe.
Ebe ị ga-ahụ 'Gypsum' bụ n'Okigwe.
3) Lead
Ebe foto si, Getty Images
Otu ihe kacha mkpa e ji 'lead' emepụta bụ 'battery'.
'Battery' bụ ihe na-enye ụgbọala, ọgbatumtum, ekwentị na ihe ndị ọzọ ike.
E jikwa lead emepụta igwe na ihe ndị ọzọ.
Okigwe na Orlu nwere 'lead' n'uju.
4) Limestone
Ebe foto si, Getty Images
Ihe e ji 'limestone' arụpụta buru ibu.
Ha gụnyere 'cement', 'ceramics' na ihe ndị ọzọ.
'Limestone' na-aka mfe igwupụta karịa nkume ndị ọzọ. Ebe e nwere ya n'Imo Steeti bụ na mpaghara Ohaji-Egbema na Okigwe.
5) Kaolin
Ebe foto si, Getty Images
'Kaolin' bụ ụdị nkume ọcha na-akwọ mụrụmụụ.
E ji ya emepụta nke Bekee kpọrọ 'ceramics', werekwa ya arụ ọgwụ na-akwụsị otoro maọbụ afọ ọsịsa.
Kaolin dị n'Ehime Mbanọ, Isu nakwa Oru North.
6) Lignite
Ebe foto si, AFP
Lignite bụ ụdị 'coal'.
Mana ọnaghị eji uji nke ukwu dịka 'coal' ndị ọzọ.
A naghị ejikarị 'lignite' akwọ ụgbọ oloko (train).
Ebe ọ na-aka egbo mkpa bụ na mmepụta ọkụ latrik.
'Lignite' dị n'akụkụ ụfọdụ n'Orlu'.
7) Bentonite Clay
Ebe foto si, Getty Images
Na mpaghara Ideato South nakwa Isu ka e nwere 'bentonite'.
Nke a bụ ụdị aja ụrọ na acha ọcha.
Ọ na-enye aka n'igwu ụmị dị icheiche dịka ụmị mmiri nke Bkee kpọrọ 'Borehole'.
Ọrụ ya bụ igbochi mmiri ịba ebe achọghị ka ọ baa.
8) Ndị ọzọ
Ebe foto si, Twitter/EmekaIhedioha
Obodo dị icheiche n'Imo Steeti nwere ọtụtụ emume ọdịnala mara mma nke ukwu.
Ọ bụrụ na e lebaa emume ndị anya ma mezie ya nke ọma, ọ ga-adọta ndị mmadụ ka ha na-abịa njem nlereanya na steeti ahụ.
Bịa tinyekwara oshimiri Ugwuta nke a na-akpọ 'Oguta Lake' na Bekee.
Ụdị ihe a bụ ihe na-amasị ndị njem nke ukwu.
Imo bụkwa steeti ala ya na-emepụta nri nke ọma.
Naanị nkọpụta nri, ma e mezie ya ọfụma, nwere ike inye gọọmentị Imo nnukwu ego.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available