Robert Mugabe: Foto na-egosi etu Robert Mugabe si bie ndụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A họpụtara onye ndụ otu Zimbabwe African National Union (Zanu) bụ Robert Mugabe dịka Praịm Mịnịsta na ngwụcha ọchịchị ndị Briten na Rhodesia (bụzi Zimbabwe ugbua).

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, Mugabe bụ naanị onye ndu ndị mba Zimbabwe ma kemgbe ha nweere onwe ha. Mugabe na ọkparaeze Wales, onye ndu Zimbabwe African People Union (Zapu) bụ Joshua Nkoma na odeakwụkwọ mba Briten bụ Lord Carrigton.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mugabe pụtara ihe dịka otu n'ime ndị ndu agha 'guerilla' megide ndị ọcha dị obere ịchị ya na Joshua Nkomo mana ha abụọ mechara see okwu.

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, Mugabe ya na Praịm Mịnịsta Briten bụ Margaret Thatcher n'afọ 1980, mgbe ọ na-achọ ime udo n'etiti ya na ọcha na-arụ ọrụ ugbo ka ha wee dozie akụnaụba ha.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Canaan Banana (no n'aka ekpe) bụ onyeisiala Zimbabwe oge Mugabe bụ Praịm Mịnịsta.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị Zimbabwe sị na ihe bidoro dịwa njọ mgbe Mugabe lụrụ odeakwụkwọ ya bụ Grace n'afọ 1996. Ha abụọ ka ị na-ahụ ebe a mgbe ha gara njem nlereanya na Vietnam n'afọ 2001.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, N'afọ 1995 Mugabe zutere onyeisiala mba Amerịka bụ Bill Clinton. N'oge a, akụnaụba mba Zimbabwe akụọla afọ n'ala.

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, Mugabe tụgharịrị uche n'agha guerrilla, na-ata ndị ọcha bụ ndị Zimbabwe na ndị mba Briten chiburu ha ụta maka nsogbu ya.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Site n'afọ 2000 gawa n'ihu, ndị bụbu ndịagha guerrilla gbakọtara n'azụ onyeisi ha wee sonyezie n'otu ndị agha mba ahụ.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ha wapkoro ndị na-ama ọchịchị aka n'ihu ma kpachie ọtụtụ ọrụ ugbo bụ nke ndị ọcha nwe.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, E gburu ihe karịrị mmadụ 100 n'ọgbaaghara dara na ndọrọndọrọ ọchịchị nke wepuru Mugabe n'ọkwa mana ọ na-eme mkpesa na ndị ọcha na-achọ ịchutu ya n'ọkwa.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Dịka onye ụka Katọlik katara ahụ, Mugabe kwuru na a zala ekpere ya site n'imeri 'ndị iro' ya nakwa mkpachị ọtụtụ ala ndị ọcha nwe.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Dịka akụnaụba mba Zimbabwe dakpọrọ n'afọ 2000, e buru amụma banyere ọdịda Mugabe ọtụtụ oge. N'afọ 2008, ọdịnihu edochaghị anya dịka ndị Zimbabwe na-aga ime ntuliaka onyeisiala

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Dịka ọ dachara inwete vootu ka a ghara imegharị ntuliaka ya na Morgan Tsvangirai, Mugabe ṅụrụ iyi na ọbụ naanị Chineke nwere ike ichutu ya n'ọkwa. N'ihi oke ọgbaaghara na-eso nke a mere ka Tsvangirai ji sepụ aka n'ịzọ ọkwa ahụ.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Dịka ọdịda akụnaụba ha gara n'ihu, Mugabe kwetere ike ọchịchị ya nye onye na-ama ya aka mechara bụrụ praịm mịnịsta.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Agbanyeghi na amụma e buru maka ọdịda Mugabe amịtaghị mkpụrụ, ọkụ a na-akwa ya pụtakwara ihe. N'afọ 2011, otu ụlọọrụ ntaakụkọ n'Amerịka dere akụkọ kwuo na ọ na-arịa 'prostrate cancer'.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, "Anwụọla m ọtụtụ oge - ebe ahụ ka m meriri Christ. Christ nwụrụ otu mgbe ma bilie otu mgbe", o kwuru n'ụbọchị ncheta ọmụmụ ya nke afọ iri asatọ na asatọ.

Ebe foto si, Keystone / Getty Images

Nkọwa foto, Robert Mugabe, 1924 - 2019

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Robert Mugabe: Ihe ndị i kwesiri ịma maka ya