Omoyele Sowore: Ndị na-eme ngagharịiwe 'Revolution Now' na-achọ ịzọ ndị otu ha a nwụchiri

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị otu ngagharịiwe 'Revolution Now' apụtaghị ime ngagharịiwe ha n'ụbọchị Tuzde 6, Ọgọst 2019 dịka ndị uweojii na ndịagha jupụtara n'ebe ha sị na ha ga-ezukọ na Legọs.

Otu onye n'ime ndị otu 'Revolution Now' bụ Usman Oloyede gwara BBC na "ngagharịiwe ka na-aga n'ihu agbanyeghi na ha anọghị n'ihu ọrụ", mana ọ dị ndị Naịjirịa n'obi.

Oloyede kwuru na ha na-aga na Panti bụ ụlọ ndị uweojii dị na Yaba, Legọs ebe ha nụrụ na-akpọchiri ndị otu ha.

"Dịka m na-agwa gị ugbua, anyị na-aga ebe ahụ ile ma a ga-atọhapụ ndị anwuchiri ụnyaahụ mana nke a agaghị akwụsị anyị".

Ndị uweojii ji anwụrụ ose chụsasịa ndị bịara ime ngagharịiwe a kpọrọ "Revolution Now"

Ndị uweojii ji anwụrụ ose chụsasịa ndị bịara ime ngagharịiwe a kpọrọ "Revolution Now" n'ọgbọegwuregwu "National Stadium" dị na Legọs.

Dịka ụfọdụ ndị mmadụ gbakọrọ iso mee ngagharịiwe na mpaghara dị iche iche, ndị nke gbakọtara na Legọs nọ na mbombo ọsọ dịka ndị uweojii na-achụ ha.

Lee foto ndị si ebe ndị mmadụ gbakọrọ na Legọs:

Nkọwa foto, Onye uweojii ji mmiri ose na-agba ndị mmadụ
Nkọwa foto, Ndị uweojii malitere ịnwụchi ndị mmadụ nakwa inyocha ekwentị ndị mmadụ
Nkọwa foto, Onye uweojii yi komkom anwụrụ ose

Ka ọ na-ewete aka ebe elekere itoolu nke ụtụtụ, ndị uweojii malitere inwe aṅụrị na-agụ egwu na ha achụsasịala ndị mmadụ.

Nkọwa foto, Ndị uweojii na-agụ egwu
Nkọwa foto, Ndị uweojii chụsasịrị ndị mmadụ na Legọs

Ndị ntaakụkọ BBC gara ebe a na-eme ya bụ ngagharịiwe nọ ebe ahụ sete ihe nkiri na-egosi ka ihe na-eme si eme.

Lee etu ndị mmadụ si na-eme "anyị agaghị ekwe" na Legọs:

Nkọwa foto, Iwe ji nwoke na-abara onye uweojii mba

N'Abuja,

Nkọwa foto, Ụgbọala ndị uweojii nọchiri Unity Fountain bụ ebe e kwuburu na a ga-agbakọ mee ngagharịiwe n'Abuja
Nkọwa foto, Ndị uweojii na-anyagharị ụgbọala ha na Unity Fountain

Na Pọtakọt,

Ndị mmadụ apụtaghị ime ngagharịiwe, mana ndị uweojii kwụchiri n'ihu Isaac Boro Park bụ ebe e kwuburu na a ga-agbakọta wee mee ya.

Nkọwa foto, Ndị uweojii na-eche Isaac Boro Park nche

Solomon Lenu bụ onyeisi otu a kpọrọ "Excellent Achievers Movement" nakwa ọnụ na-ekwuchitere otu "Renaissance for Peace and Empowerment Initiative" na-akwado ngagharịiwe a na Pọtakọt, gwara onye ntaakụkọ BBC na ha agaghị emezi ngagharịiwe makana gọọmentị ewerela ndị ọrụ nchekwa nọchie ebe niile.

O kwuru sị na ha achọghị itinye ndụ ndị mmadụ bụ ndị e ji maka ha ekwu okwu ya bụ ngagharịiwe na nsogbu.

Nkọwa foto, Ndị uweojii na-eche nche ịhụ na ndị mmadụ agbakọghị mee ngagharịiwe n'ihu Isaac Boro Park

Cheta na aka na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike, nyere iwu sị na ọ chọghị iji ntị anụ na e mere ụdịrị ihe a na steeti ya.

Na Kano,

Ndị mmadụ apụtaghị isonye na ngagharịiwe e yiburu na a ga-eme na Kano.

Nkọwa foto, Ebe e yinyeburu na a ga-esi malite ime ngagharịiwe "Revolution Now"
Nkọwa foto, Ebe e yinyeburu na a ga-esi malite ime ngagharịiwe "Revolution Now"