Tonto Dikeh: Ihe mere ya na Churchill ji ewu na soshal midia

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Tonto Dikeh ataghị ata nke ọ ji abụ abụ mgbe ọ na-akọsara ndị ntaakụkọ gbasara ihe seere ya na di ọ gbagoro alụkwaghịm.

Ọ gwara onye ntaakụkọ a ma dịka 'Daddy Freeze' na Churchill bụ di ọlụburu na mbụ, bụ onye na-eme mpụ ma bụrụkwa nwoke na-ezughị oke.

Mana kemgbe ọkọsachara ndị ntaakụkọ ya bụ ihe, ndị mmadụ akwadola ya ebe ụfọdụ katọrọ ọtụtụ ihe o kwuputere.

@collinsweglobe kwuru na Tonto echezọkwala mgbe o ji Churchill eme ọnụ.

@mhzkatty si Tonto ya zuzie ike gbasara esemokwu dị n'etiti ya na Churchill.

Mana ndị a na-ekwu ihe ọzọ

@Firstosaz kwuru na Tonto na-eme ihe dimma site n'ikwupute ihe ọjọ niile di ochie ya mere ya n'onyonyo.

@ambition05 kwuru na ọ bụ mgbe ihe wutere nwaanyị nke ukwu ka o na-ekwupute uche ya.

Dịka ọ dị ugbua, di ochie ya o boro ebubo ndị a apụtabeghị zọrọ isi ya maọbụ tinye ọnụ n'okwu a.