You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Tonto Dikeh: Ihe mere ya na Churchill ji ewu na soshal midia
Tonto Dikeh ataghị ata nke ọ ji abụ abụ mgbe ọ na-akọsara ndị ntaakụkọ gbasara ihe seere ya na di ọ gbagoro alụkwaghịm.
Ọ gwara onye ntaakụkọ a ma dịka 'Daddy Freeze' na Churchill bụ di ọlụburu na mbụ, bụ onye na-eme mpụ ma bụrụkwa nwoke na-ezughị oke.
Mana kemgbe ọkọsachara ndị ntaakụkọ ya bụ ihe, ndị mmadụ akwadola ya ebe ụfọdụ katọrọ ọtụtụ ihe o kwuputere.
@collinsweglobe kwuru na Tonto echezọkwala mgbe o ji Churchill eme ọnụ.
@mhzkatty si Tonto ya zuzie ike gbasara esemokwu dị n'etiti ya na Churchill.
Mana ndị a na-ekwu ihe ọzọ
@Firstosaz kwuru na Tonto na-eme ihe dimma site n'ikwupute ihe ọjọ niile di ochie ya mere ya n'onyonyo.
@ambition05 kwuru na ọ bụ mgbe ihe wutere nwaanyị nke ukwu ka o na-ekwupute uche ya.
Dịka ọ dị ugbua, di ochie ya o boro ebubo ndị a apụtabeghị zọrọ isi ya maọbụ tinye ọnụ n'okwu a.