You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kedụ ihe mere Mofe Duncan na nwunye ya ji gbakụta onwe ha azụ?
Onye ihe nkiri ama ama bụ Mofe Duncan na ya nwunye bụ Jessica Kakkad achịsala ọwa n'ihe gbasara alumdinanwunye ha ka afọ atọ gachara ha jiri lụọ.
Duncan, onye kwupụtara nke a n'igwe okwu Instagram ya ụbọchị Fraide kwuru na o ruola otu afọ ga gbasara kama na ezinaụlọ ha abụọ ka dị na mma.
Ọ gara n'ihu kele ndị na-akwado ya.
Jessica kelekwara ndị ihe ya na-amasị maka nkwado ha.
Duncan bụ onye ihe nkiri riterela nzere maka ihe nkiri o merela.
Ihe nkiri Duncan onye Delta steeti merela gụnyere Ovys Voice, Sons of the Caliphate na Three Kings.
Jessica Kakkad onye nna ya bụ onye Indịa mana nne ya bụ onye Edo bi na Lọndọn ebe di ya nọ na Naijiria tupu ụgbọ ha akụkasịa.
Ebe ụfọdụ ndị ihe ha na-amasị na-ekpere ha ekpere ọma, ndị ọzọ na-ata ha ụta.
Kepukepu na-ekwu nsogbu dị na etiti ha agbaala afọ mana ha abụọ enweghi onye kpọrọ okwu aha were rụọ n'izu a.