Dehlia Umunna : Ihe asaa ị maghị maka ada Igbo e ji eje mba
Ebe foto si, @Harvard_Law/Twitter
Akụkọ Dehlia Umunna bụ nwa ada Igbo na-achake ka ọnwa na mba ofesi bụ ihe na-ewu na soshal midia ugbua.
Nwada a bụ onye Naijiria mbụ na-abụ ọkamụta n'okwu gbasara Iwu( Clinical Professor of Law) na mahadum ọkaibe bụ Harvard nke a na-enweta ọkwa ahụ.
Tupu e bulite ya n'ọkwa ahụ, Umunna na-akụzi na ya bụ mahadum kemgbe afọ 2007.
Ọ natala ọtụtụ nturugo dịka ọkaiwu kajara akaja nakwa onye nkuzi pụrụ iche.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Nkwenye Dehlia gbadoro ụkwụ na ndụ ya pụtara ihe n'okwu ya.
Ọ sịrị, "Ọ bụ oke na ọrụ dịrị m dịka nwaanyị isi ojii ị bụ ọkaibe iji nye onye ga-eso m n'azụ ebe nlekwasị anya."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Lee ihe ndị ị maghị maka nwa afọ ahụ:
1. Ọ bụ n'ọnwa Eprelụ, afọ 2016 ka o nwetara ọkwa ọkammụta Iwu mana ọ bụ ugbua ka akụkọ ahụ wubere n'ala Naijiria dịka ụmụ Naijiria gara bọlite ya bụ okwu
3. Ada Igbo a dị afọ iri anọ na anọ bụbu onye nkuzi na ngalaba Iwu na mahadum 'George Washington University Law School.'
4. O so na otu jịkọrọ ndị omeiwu nke Massachusetts,MarylandColumbia nakwa New Jersey
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
5. Ọ gụrụ maka mgbasaozi na mahadum 'California State University' dị na San Bernardino, Mba Amerịka.
6. O mechara nke a nata asambodo na Chịkọta ọha (Masters in Public Administration) na'Harvard Kennedy School of Government.'
7. Umunna gara n'ihu gụọ ihe gbasara Iwu na mahadum, 'George Washington University Law Center.'
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available