Father Clement Ugwu: 'Ndị ụka Kristi enweghi olileanya na nchekwa Naịjirịa' - Bishop Odedeji

Bishop ndị ụka Anglịkan na mpaghara ọdịda anyanwụ Legọs bụ James Olushola Odedeji akatọọla ọnwụ Fr. Clement Ugwu.

O kwuru na ọ bụ ihe ọjọọ nke mere na ndị ụka kristi enweghizi olileanya na nchekwa ala Naịjirịa.

O kwuru nke a mgbe ọ gara ụka mmamma a tụrụ maka ụkọchukwu nọ n'okpuru ya nwunye ya gbalahụrụ ọnwụ site n'ihe mberede ụgbọala.

Nkọwa foto, Ụkọchukwu Umeh biara ịtụ mmamma maka etu chukwu si napụta ndị be ya n'aka ọnwụ.

O kwukwara na ọ dị mwute na o nweghi ihe ndị ọchịchị na-eme gbasara oke mwakpo, ntọrọ nakwa ohi na-arị ibe ya elu na Naịjirịa.

"Ndị ụkọchukwu dị ka ndị ọrụ enyemaka, ha ekwesighi ịgabiga ụdịrị ihe ọjọọ a" ka ọ gwara BBC Igbo.

Cheta na ndị ntọ gburu Clement Ugwu n'Enugwu n'agbanyeghi na ezinaụlọ ya na-akwụ ego mgbapụta ha sị ha kwụọ.

Akụko ndị ọzọ ga-amasị gị