Imo State Election 2019: Uche Nwosu ka so n'ihe a na-eme - FCC Jones
Ebe foto si, Uche Nwosu
Ọnụ na-ekwuchitere Pati Action Alliance bụ Onwuasoanya FCC Jones akatọla akụkọ na-ekwu na Uche Nwosu esoghizi azọ oche gọvanọ na ntuliaka n'Imo steeti.
Ọ katọkwara okwu na-ekwu na gọvanọ Rochas Okorocha na-echegharị maka ịkwado pati AA na ntuliaka na-abịanụ.
Jones kwuru na okwu niile a bụ ụgha ma na-ekwukwa na Okorocha ka kwụsị ike na-azụ Uche Nwosu nakwa ndị niile na-azọ oche ụlọomeiwu nke steeti n'okpuru pati Action Alliance.
Ọ rịọkwara ka akụkọ ụgha a ghara ime ndị ụmụ Imo gbajọọ itunyere pati AA na ntuliaka nke ọkwa gọvanọ nakwa ụlọomeiwu nke steeti.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available
{{rankTranslation}}