Nigeria Elections 2019: Nwoke akụpụla nwunye ya eze maka ọ chọrọ Buhari
Ebe foto si, @MBuhari
Otu nwoke aha ya bụ Abdullahi Yadau chụrụ nwunye ya makana ọ sị na o geghi ya ntị mgbe ọ gwara ya kwụsị ịkwado Onyeisiala Muhammadu Buhari.
Tupu nwoke a achụọ ya bụ nwaanyi, o tiri ya ihe, ma kụpụ ya eze.
Abdullahi gwara BBC na ya adịghị alụzị nwunye ya bụ Hafsat Suleiman ka ọ gwara ya na "ọ bụ Onyeisiala Muhammadu Buhari ka ọ ga-atunyere na ntuliaka 2019."
Ọ sị na o buru okwu a gakwuru nne na nna nwaanyị, bu ebe okwu no banye ọgụ mere o ji kụpụ ya eze.
BBC gbara mbọ nweta olu Hafsat, mana ndị be ya sọ na ọ nọghị n'ọnọdụ ikwu okwu.
Mana, nwanne ya nwoke bụ Ibrahim Suleiman kwuru na ihe a mere n'eziokwu.
Ibrahim sị na nwanne ya "agaghị alaghachi be Yadau ọzọ."
Ma kwukwa n'ihe bụzị ezigbote nsogbu n'etiti ezinaulọ ha nakwa nke Yadau.
Isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available