Minimum Wage: Etu ngagharịiwe ndị NLC si aga

Nkọwa foto, Ngagharịiwe otu jikọtara ndị ọrụ maka ụgwọ ọnwa opekatampe dị puku naịra iri atọ

Ndị otu "Nigerian Labour Congress (NLC)" ebidola ngagharịiwe taa n'ihi ụgwọ opekatampe ọhụrụ nke gọọmenti na-ekwebeghị ịkwụ ha.

N'afọ gara aga, otu gọọmentị hiwere maka inyocha ego ole a ga-akwụ ndị ọrụ wepụtara akwụkwọ ka gọọmentị kwụọ ndị ọrụ puku naịra iri atọ.

Ebe foto si, Peter Dibia Nnadozie/Facebook

Nke a bụ ihe kpaliri iwe ndị NLC, ha ji eme ngagharịiwe na steeti niile dị na Naịjirịa.

Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ onyeisi ndị ọrụ n'Imo Steeti bụ Austin Chilakpu, o kwuru na ngagharịiwe a bụ iji gosipụta iwe ha banyere ọnọdụ ụgwọ ọnwa opekatampe.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ ka ndị mmadụ nụrụ olu ha tupu ha amalite abụbọọrụ kama na mkpebi ahụ ga-esi n'aka ndị isi ha.

Akụkọ ga-amasị gị