Charly Boy: Ọ bụghị alụkwaghịm kama ọ bụ inwogharị ịhụnanya anyị
Ebe foto si, Charlyboy
Charly Boy kwuru na ọ bụ inwogharị ịhụnanya dị n'etiti ya na nwunye ya bụ Diane "Lady D", ka ọ chọrọ ime na ọ bụghị ịgba alụkwaghịm.
Charly Boy kwuru nke a mgbe BBC Igbo kpọtụrụ ya n'ekwentị ịjụ ihe mere o ji dee na soshial midia na ọ chọrọ ịgba nwunye ya alụkwaghịm ma lụgharịa nwaanyị ọzọ.
N'elu soshal midia, o dere na ọ na-agba nwunye ya alụkwaghịm makana "ha abụọ ahụchaala onwe ha, na oge eruola maka ihe ọhụrụ".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ka BBC Igbo jụrụ ya ajụjụ a, o were olu ọchị sị "ehenụ! Anaghị m alụzị makana anọọla m ebe ahụ afọ iri anọ, anyị asị ka anyị "chenjikwaanụ gear".
"Mana mmadụ ole ghọtakwaranụ na ọ bụ otu onye ahụ ka m na-aga ịlụ?
"Ị ga-agba alụkwaghịm n'otu ụbọchị ma lụọ nwaanyị ọzọ n'echi ya? Enwerenu etu ọ dị.
M na nwunye m na-alaghachị n'ụlọọụka inwogharị mkpebi ịhụnanya anyị kpebiri afọ ole gara aga."
O kwuru na onweghi mgbe ọ chọrọ ịgba alụkwaghịm kama na ndị mmadụ ghọtaghiere ihe o dere n'akara soshal midia.
Cheta na Charly Boy na Diane ebiela ihe ruru afọ iri anọ ma nwekwaa ọtụtụ ụmụ na ụmụ ụmụ gbara ha gburugburu.
Isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available