Akụkọ dị mkpa na mgbede a: Ị dị njikere maka idemmiri?

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ngalaba na-ahụ maka mgbanwe mbara igwe adọọla ndị bi n'akụkụ mmiri aka na ntị sị ha kwara nwgongwo ha gbaa ọsọ maka idemmiri na-abịa.

Steeti ndị ọ ga-ememtụta bụ Anambra, Delta, Bayelsa, Niger nakwa Kogi.

Ọzọ,

Ebe foto si, David Umahị onn Facebook

Aka na-achị Ebonyi steeti bụ David Umahi agbachiela ọdọ mmanụ agbidi Dipro n'Ebonyi steeti iji mee nyocha ebubo ire mmanụ Kerosene adịgboroja e boro ha.

Cheta na ụmụaka abụọ nwụrụ n'ụbọchị Fraịde gara-aga ebe Kerosene adịgboroja esi n'ọdọ mmanụ ahụ zụta gbara ọkụ.

N'Abuja,

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Taa ka aka chịburu Kano steeti bụ Rabiu Kwankwaso kwuputara na ya esonyela n'ịzọ ọkwa ọchịchị Naịjirịa na ntuliaka 2019.

Kwankwaso forola ntutu taa na ya ga-emeri Buhari ebe a kagburu ohere enyere ya iji ọgbọ egwuregwu Eagles Square mee nkwuputa ya taa.

Na mba ofesi,

Ebe foto si, Getty Images

Praim Minista mba Jamini bụ Angela Merkel na-akwado ime njem nke ya bịa Naịjirịa ebe ibe ya nke mba Briten bụ Theresa May tụrụ ụkwụ taa na Naịjirịa.

Ọ nọ Abuja ugbua ebe ya na Onyeisiala Muhammadu na-enwe nzukọ imeụlọ.

N'Egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images

Hal Robson-Kanu onye ọgba bọọlụ Wales esorola ibe ya chilie bootu elu n'ịgbara ala ya bọọlụ.

Robson-Kanu kwuru na o mere nke a inye ya ohere ihazi ezinaụlọ ya nakwa ịgbara otu klụb ya bọọlụ.

Gee Nkeji nke mgbede a

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile