Akụkọ dị mkpa na mgbede a: Ewepụla ọnụ na-ekwuchitere ụlọomeiwu na Platu steeti na onye ndu ndị ụlọomeiwu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Akụkọ ndị dị mkpa

Ebe foto si, Rodney Patrick

Okwu na-ewu n'elu soshal midia ọkachasị Twita bụ ihe gbasara ikikere nwaanyị ịzụta maọbụ rite ala n'aka nna ya n'ala Igbo.

Ụfọdụ na-ekwu na ha kwenyere n'omenala a ebe ndị ọzọ na-ekwu n'oge eruola iji gbanwe ya bụ omenala.

Ndị ụlọomeiwu Imo steeti nwere nzuko n'isi osote gọvanọ ha bụ Eze Madumere ekpebiela na ọ bụ ọkaikpe nke steeti ahụ ga-ekwu ma aga-achupụ ya n'oche ọchịchị n'ime ọnwa atọ maọbụghị.

Cheta na ndị ụlọomeiwu nke Imo steeti kwuru na ha ga-achutu Madumere maka ebubo nrụrụaka ha boro ya.

N'okwu yiri ibe ya

Achụturu Peter Azi bụbu ọnụ na-ekwuchitere ụlọomeiwu nke Platu steeti n'ọkwa ya n'ehihie taa.

Onye ọọ ewepụrụ bụ inyeisi ndị kachasị n'ọnụọgụgụ bụ Henry Yunkwap.

N'akụkọ ofesi

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Praim minista mba Jamini na Onyeisiala mba Amerịka amaala aka dịka ha na-akwado ịga nzụkọ otu NATO na Brussels.

Donald Trump na-ebo ụfọdụ mba n'ime ọgbakọ ahụ ebubo ịkpachi ego ha.

N'Egwuregwu,

Ebe foto si, BBC Sport

Ebe niile tọgbọ chakoo ugbua na mba Briten ebe otu egwurewgwu ha na-akwado ị zute Kroeshia na asọmpị ga-egosi onye ga-abịa nso ị bu ikombaụwa.

Anyị ga-ama onye ga-emerị ma ọ kụọ elekere asaa nke mgbede a.

Gee nkeji nke mgbede a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile