Ima aha ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ekwuru na aka ha dị na oke ogbugbu na-eme na Naịjirịa?

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mohammadu Buhari achịla Naịjirịa dịka onye agha na onye ọdịnala.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Femi Adesina si na onweghị ihe onwere ikwu gbasara akwụkwọ onye otu ya bụ Garba Shehu depụtara maka nsogbu dị n'etiti ndị ọrụ ugbo na ndị ọchịehị.

O nyere usaa a mgbe BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ taa.

Na mbụ, onye ndụmodụ ukwuu n'ihe gbasara mgbasa ozi n'ụlọọrụ onyeisala Naịjịrịa bụ Shehu Garba deputara okwu a n'akwụkwọ o wepụtara ụbọchị Julaị 8.

N'ime akwụkwụọ ahụ o kwuru na ndị ndọrọndọrọ ọchichị a na-akpọpụtaghị aha ha na-eji ndị ekperima eme oke ogbugbu a.

Shehu kwukwara na mgbanwe ịhụ igwe nakwa nkpọnwụ ''Chad Basin'' sokwa eme ka nsogbu oke ogbugbu a bawanye.

O kwere nkwa na gọọmentị etiti na-agba mbọ n'ịhụ na ya bụ nsogbu nwetere ogbugbo tọrọ atọ.

Shehu rịọkwara ndị Naịjirịa na ndị mba ofesi ka ha kwụsị gbasa ozi ụgha gbasara nsogbu a.

O kwuru na o dimkpa ka ndị na-achị steeti, ndị ọrụ nchekwa, na mba ofesi jịkọta aka gboo mkpa a.

N'ọnụ ya, nsogbu ndị ọchị ehị na ndị ọrụ ụgbo bụ ihe diwara kamgbe gboo. Ihe na-ebute ya bụ miri emi.''

Lee ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia:

Patrick Ibeawuchi kwuru na o chere na onyeisiala kwuburu na ọ bụ ndị oyi egwu Libya na-ebute nsogbu a?

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Elisha Bello na-agwa onyeisiala ka o nwuchie ndị a o na-ekwu nwere aka na nsogbu ochiehi na ndị ọrụ ugbo.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Shyne na-agwa ụlọọrụ onyeisiala ka ha kwusi ị nye usaa kpatara nsogbu kama ha chọọ ogbugbo ya.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Akụkọ ndị ga-amasị gị: