Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: EFCC si na ha agaghị enye nrụrụaka ohere na 2019
EFCC na-enyocha ụlọakụ na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị

Ebe foto si, @officialEFCC
Ka a na-akwado ntuliaka nke 2019, ngalaba na-ahụ maka mpu na aghụghọ bụ EFCC na-enyocha ụlọakụ na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị maka ịchọpụta ndị na-enupu isi n'iwu ego nrụrụaka
Ndị agha na ndị uweojii kwara isi n'Aba ụnyaahụ

Ebe foto si, Getty Images
Anya hụrụ mgbe ihe a mere kwuru na nsogbu bidoro mgbe ndị agha kparala onye uweojii aka ma chọ ịkpụba ya n'ụlọọrụ ha.
Ndị ntaakụkọ na-ekwu na mgbọ egbe gbụrụ mmadụ atọ n'ọgbaghara a ka ndị ọzọ ekwughị ole ha dị merụrụ ahụ.
Paul Manafort agaala mkpọrọ

Ebe foto si, Getty Images
Onye bụbụ onye nhazị ndọrọndọrọ ọchịchị nke onyeisiala Amerịka Donlad Trump bụ Paul Manafort nọ na nga.
Nke a mere ka ọkaikpe na Washington DC kwuru na Manafort na-amaja ndi ga-agba akaebe n'ikpe ya.
Super Eagles na Kroeshịa na-akwado ịsụ mpi

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ taa ka Naịjirịa ga-ebido njem ibute iko mbaụwa. Ndị Super Eagles ga-ezute Kroeshịa na-elekere asatọ nke abalị a.
Cheta na Ronaldo nke Portugal ritere goolu atọ n'asọmpị a na Spen gbara nhatanha.
Gee akụkọ anyị
Lee ihe nkiri anyị n'ụtụtụ a





























