Offa: Saraki ga-aza ma a kpọọ ya n'ụzọ ziri ezi - Onye ndụmọdụ Saraki

Ebe foto si, Bukola Saraki/Twitter

Nkọwa foto, E boro Saraki ebubo ohi,mpụ na ihe ndịọzọ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onye ndụmọdụ Saraki n'ihe gbasara iwu na ọchịchị bụ Kingsley Amaku ekwuola na ha enwetebeghị ozi ndị uweojii, na ọ bụ n'akụkọ ka ha nụrụ ya.

Amaku gwara BBC Igbo n'ekwentị na ha ga aza ndị uweojii ebubo a ma ha kpọọ ya oku n'ụzọ ziri ezi.

N'ọnụ ya "Ọ bụ onye mere ihe ọjọọ na-atụ egwu, Saraki emeghị ihe ọjọọ, ọ na-eche ozi ndị uweojii n'ụzọ ziri ezi".

Ebe foto si, @policeNG

Nkọwa foto, Ụgọala bu akara aha Saraki

Cheta na ụmụ nwoke ise kpọrọ Saraki aha na nyocha a na-eme gbasara ohi ụlọakụ n'obodo Offa kpụrụ ndụ mmadụ ruru 33 n'ọnwa Eprelu epuola mpi ọhụrụ.

Nke a mere ka ndị uweojii kpọọ Bukola Saraki oku ị bịa zara ọnụ ya maka ebubo ahụ mmadụ ise n'ime ndị anwụchiri boro ya.

Ndị uweojii kwuputara nke n'akara soshal midia ha nke Twitter.

Ha kwuru sị na site nyocha e mere na ha na-akpọ Bukola Saraki oku ka ha nwee nzụkọ iji zara ọnụ ya maka ebubo eboro ya.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ụmụnwoke ise a bụ ndị ndụ otu ndịohi dị ịcheche, kwuru na Bukola Saraki nakwa Abdulfatah Ahmed bụ gọvanọ na-achị Kwara steeti na-ebunye ha ego na egbe ha ji aga ohi.

Dika ụlọọrụ ntaakụkọ Sahara Reporters kwuru, ndị ohi ahụ anwụchiri bụ kwa ndị na-eyi mmadụ egwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ha sị na aha otu ha bụ "Youth Liberation Movement" maọbụ "Good Boys".

Ebe foto si, @PoliceNG

Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị ohi a ka a na-egosi ha ọha

Yusuf Olaniyonu bụ onye na-ekwuchitere Bukola Saraki onụ gwara BBC na ha ga-azaghachi oku n'oge adịghị anya.

Ndị ọzọ nọ na soshal midia akatọla oku a na-ekwu na ndịuweojii kwesiri ị kwanyere ọkwa Saraki dịka onyeisi ndị Sineti ugwu.

Ha sị na e kwesiri ị kpọ ya oku n'ụzọ ziri ezi n'abụgị n'elu soshal midia.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Akụkọ ga-amasị gị