Ọgbaghara Taraba: Ghọta nụ na m na-arụ ọrụ - Buhari

Ebe foto si, AFP/Getty

Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ọbụghị ebe ọbụla ọgbaaghara dị ka ọ ga-aga.

O kwuru nke a ebe ọ gara ileta ndị Taraba steeti ebe ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ n'ihe ike mere n'etiti ndị ọchịehi na ndị obodo ahụ.

Ọ sị na-ọdịghị mfe ị ga-ebe niile ihe mere n'ala Naịjiria ebe ọ bụ na o nwere ndị na-ewetara ya akụkọ ihe na-aga n'ala.

Ọ sị kwa na ihe mere oji gaa Taraba steeti bụ na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ ebe ahụ kacha ndị nke Benue na ndị Zamfara steeti.

Nkọwa foto, Mambila bụ ebe ọhụrụ enwere mwakpo n'etiti ndị ọchịehi na ndị mmadụ

Onye enyemaka Gọvanọ na-achị Benue steeti gwara BBC n'elu ekwentị na ha amabeghị mgbe onyeisiala ga-abịara ha mgbaru ụlọakwa ka o sị kwuo.

Mana ọ sị kwa na ha nwere olileanya na ọ ga-abụ mgbe Buhari ga-esi Ghana lọta.

BBC gbalịrị ịnweta Lai Mohammed n'ekwentị mana ka-anyị na-ede akụkọ a, onwebeghị isi.

Cheta nụ na ihe karịrị mmadụ iri nwụrụ n'ihe a mere n'etiti ndị ọchịehi na ndị obodo Mambila n'ọtụtụ ụbọchị gara aga.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: