Izu Afrịka na foto: Site Febrụwarị 16 ruo 22 nke 2018

Nhọpụta foto kacha mma si na mpaghara Afrịka na nke ndị Afrịka nọ ebe ndị ọzọ n'ụwa n'izu a.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ọbụghị kwa ụbọchị ka ị ga-ahụ enyi kpodoro isi n'ala ma koro n'ikuku - mana n'ụbọchị Wenesde na obodo Nyeri county dị na Kenya, ihe a bụ ihe mere eme.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ọ bụ ndị mmadụ nọ na-efe efe n'Abidjan, Ivory Coast, ka a na-eme mmemme bekee kpọrọ circus nke mbụ ha.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Na Zimbabwe, ndị mmadụ gbakọrọ iru uju maka ọnwụ onyeisi otu Movement for Democratic Change (MDC) bụ Morgan Tsvangirai, onye nwụrụ ka ọ dị afọ 65.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, N'otu ụbọchị ahụ, otu nne mụrụ nwa ya n'ụlọọgwụ dị na Juba, South Sudan. Obodo ahụ bụ otu n'ime ebe ndị kachasị njọ inọ mụọ nwa n'ụwa, dịka Unicef kwuputara n'izu a.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, N'Ethiopia, ndị agha lara ezumike nka mere ncheta ndị egbuchapụrụ n'Addis Ababa, oge ndị agha Italy bigidere ha gburu ndị Ethiopia ruru 20,000 n'ụbọchị 19 nke Febrụwarị, 1937.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị Libya chetakwara ụbọchị dị mkpa n'izu a. Ụbọchị 17 nke Febrụwarị, mere ya afọ asaa nke ọgbaaghara butere nchutu Col Muammar Gaddafi.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Igafee oke, Egypt na-akwado maka ntuliaka. Ndị nkwado tinyere ọkọlọtọ mgbasa ozi maka onyeisiala ha na Cairo n'izu a.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Saụt Afrịka enwebeghị ntuliaka, mana ha nwere onyeisiala ọhụrụ. Ahụrụ Cyril Ramaphosa ebe a tupu o mee nkwuputa gbasara ihe na-eme n'obodo nke bekee kpọrọ State of the Nation address. Ọ ga-amasị anyị ịma ihe nwaanyị a hụrụ ugbu a.

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, N'akụkụ ụwa ọzọ na mba Saụt Korea, onye ọsọ skeleton si Ghana bụ Akwasi Frimpong nọ na-egosi nwa ya enyi ọhụrụ.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Mana na Kenya, echiche na-abanye n'ime asọmpi nnukwu na-abịa - egwuregwu Commonwealth n'Australia n'Eperelụ.

Ndị nwe foto a bụ AFP na EPA