Queen Elizabeth II: Foto ndị gosiri nchịkọta ndụ ya

Ebe foto si, ANNIE LEIBOVITZ

Ezenwaanyị Elizabeth II biri ndụ ya n'anya ọha. Ka anyị leba anya etu o si bie ndụ site mgbe ọ dị na nwata, ruo mgbe chiri ya echichi nke ọ ji bụrụ onye ọkachasị nọtee aka n'ọkwa ọchịchị mba Briten.

Ebe foto si, PA Media

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, A mụrụ Elizabeth Alexandra Mary Windsor na 21 Eprelụ 1926, n'ụlọ dị nso na Berkeley Square nke London. Ọ bụ nwa mbụ nke Albert, Duke nke York - nwa nke abụọ nke George V - na nwunye ya, bụbụ nwada Elizabeth Bowes-Lyon

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Afọ mgbe ọ ka dị na nwata, o nweghi onye hụrụ maọbụ chee na akaraka ya bụ ịrịgoro n'ocheeze

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Etu ọ dị na, o gosiri na ọ mara oke na ọrụ dịịrị ya site mgbe ọ dị obere

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Elizabeth na nwanne nwaanyị, Margaret Rose, onye a mụrụ n'afọ 1930, mụrụ akwụkwọ n'ụlọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Site n'ọpụpụ n'ocheze nke Eze Edward VIII pụrụ na1936, e chiri nna Elizabeth Eze George VI, ebe Elizabeth bụrụzie onye na-esote ọkwa ocheze (heir)

Ebe foto si, Topical Press Agency / Getty Images

Nkọwa foto, N'oge agha World War Two, a kpọgara Elizabeth na nwanne nwaanyị bụ Margaret na Windsor. Foto a gosiri mgbe ha na-agbasa ozi n'ụwa n'emume oge ụmụaka nke ụlọọrụ BBC

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Obere Adaeze mechara soro ndị agha 'Auxiliary Territorial Service (ATS)' na ngwụcha agha, dịka ọ na-amụ ka e si anya nakwa ịrụzi ụgbọala

Ebe foto si, Bert Hardy / Getty Images

Nkọwa foto, N'afọ1947 ọ lụrụ nwa nwanne nna ya (distant cousin) bụ Philip Mountbatten, onye mechara bụrụ Duke nke Edinburgh

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Nwa ya nke mbụ bụ Charles (foto), onye a mụrụ n'afọ 1948, nwanne ya nwaanyị na-eso bụ Anne, a mụrụ n'afọ 1950

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Elizabeth dikotara nne ya nso n'oge ndụ ya niile. Foto a gosiri mgbe ha gara agbamakwụkwọ n'afọ 1951

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Na Jeụwarị afọ 1952, Elizabeth na Philip mere njem nlereanya n'ofesi n'aha nna ya, bụ onye na-arịa ahụ. Eze nwụrụ dị ka ọ na-ehi ụra n'ụbọchị ole na-eso

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Elizabeth lọghachitere n'ụlọ ngwa ngwa. Ezenwaanyị nke ọhụrụ a dị naanị afọ 25

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Akwamozu Eze. Ebe a Ezenwaanyị Mary, bụ ne ya, na-ekiri dịka e butere ozu George VI n'ọgbọ nzukọ Westminster dị na London, maka nkwanye ugwu nke ikpeazụ. Ezenwaanyị Elizabeth guzoro n'azụ nne nnenne ya, ebe nne ya nọ n'aka ekpe

Ebe foto si, Universal History Archive

Nkọwa foto, N'ọnwa Juun afọ 1953, e chiri Elizabeth Ezenwaanyị na Westminster Abbey

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Site n'echichi a, Ezenwaanyị Elizabeth II na Duke nke Edinburgh pụtara n'ihu Obieze Buckingham na na-efere ọha aka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N'agbanyeghi na Briten ka na-agbake site n'agha, ụfọdụ ndị nkọwa sị na echiche Elizabeth a bụ ọwụwa ụbọchị ọhụrụ. Ebe Ezenwaanyị Elizabeth II rịgooro na steepụ nke Opera dị na Paris, France

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, N'afọ 1957, Ezenwaanyị pụtara na TV ma gbasaa ozi ekele Ekeresimesi nke mbụ ya nye mba ha

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Agwa ndị Briten na-akpasị Obieze malitere ịgbanwe ma a gbanwe "the Monarchy" ka ọ bụrụzie "the Royal Family". Ndị agbataobi na-ekiri Ezenwaanyị mgbe ọ gara ileta ezinaụlọ Eddie Hammond na Crawley New Town, Sussex n'afọ1958

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, N'etiti ọrụ ya dịka Ezenwaanyị, ọ na-ewepụta ohere pụrụiche nye ezinaụlọ ya - Ebe ka ya na nwa ya nwaanyị Adaeze Anne na Frogmore, dị na Windsor Castle

Ebe foto si, Mirrorpix / Getty Images

Nkọwa foto, N'afọ 1966, n'ọgbọegwuregwu Wembley, Ezenwaanyị bunyere Bobby Moore bụ onye ndu ndị otu egwu bọọlụ Ịngland iko Jules Rimet maka idu ha mabute Iko Mbaụwa site n'imeri West Germany

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Na 29 Ọktoba afọ 1966, Ezenwaanyị gara nleta n'obodo Welsh nke Aberfan, mgbe ala mbuze mere na Pantglas Junior School ma gbuo mmadụ 144, nke 116 n'ime ha bụ ụmụaka. Nke wutere Ezenwaanyị nke ukwuu ma bụrụ ọkwa otu n'ime oge nwute kachasị mee n'oge ọchịchị ya.

Ebe foto si, Mirrorpix / Getty Images

Nkọwa foto, N'afọ1969, mgbe mbụ e bipụtara akụkọ banyere Ezinaụlọ Onyeze. O gosiri ọha ọtụtụ ihe banyere ndụ, ọrụ nakwa ezinaụlọ Ezenwaanyị.

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Ezenwaanyị chiri nwa ya bụ Ọkparaeze Charles echichi dịka Ọkparaeze Wales n'emume e mere na Caernarfon Castle. O were ọkwa ahụ mgbe ọ dị afọ itoolu mana Ezenwaanyị sị na ọ ga-eche ruo mgbe ọ matara ihe tupu e chie ya echichi ahụ.

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, N'oge ọchịchị ya niile, ụmụanụmanụ corgis na-anọkaarị n'akụkụ Ezenwaanyị. Ọdịmma ezinaụlọ Onyeze na ụdịrị anụmanụ ndị a malitere mgbe Eze George VI zụtaara ada ya nwaanyị corgi a kpọrọ Dookie n'afọ 1933

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Na 1977 mba ha mere emume ncheta afọ iri abụọ na ise (Silver Jubilee), Ezenwaanyị malitere ịchị. Ọtụtụ igwe mmadụ zutere ya dịka ọ na-agagharị na mba ha.

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Ezenwaanyị mere njem nleta na mba 36 n'ime izuụka 10 - gụnyere Avon, ebe o kiriri ndị na-egwu mmiri n'oge okpomọkụ. O mekwara njem ruru 56,000 miles n'ụwa n'oge ahụ.

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Ezenwaanyị na duke mgbe ha nọ n'ụgbọmmiri Royal Yacht Britannia mgbe ha na-aga na mba Barbados

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Dịka afọ na-agbada ọrụ ya dịka Ezenwaanyị nọkwa na-aga n'ihu. Ya na Duke nke Edinburgh nabatara ndị New Zealand Maori na mgbape emume Royal New Zealand Polynesian

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, N'ọnwa Ọgọstụ 1979, ka e gburu nwanne nna Ọkparaeze Philip na nwa nwanne Ezenwaanyị bụ Louis Mountbatten, Earl Mountbatten nke Burma mbụ, site n'ogbunigwe mgbe ọ na-aga mba in Ireland n'ụgbọmmiri. N'ihi mmekọrịta ya na ezinaụlọ Obieze, Lord Mountbatten ji ọtụtụ ọkwa dị elu n'ọrụ ndịagha, e liri ya na Westminster Abbey

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, N'afọ 1981, Ọkpara Elizabeth bụ Charles lụrụ nwada Diana Spencer. Charles na Diana mụrụ ụmụ abụọ, William na Harry, tupu ha agbaa alụkwaghịm. Diana nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ na Paris n'afọ 1997.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Na mgbasaozi Ekeresimesi ya, Ezenwaanyị kọwara 1992 dịka "annus horribilis", maka etu ụmụ ya atọ gbachara alụkwaghịm nakwa ọkụ gbara na Windsor Castle.

Ebe foto si, David Cooper/Alamy

Nkọwa foto, Ndị mmadụ katọrọ iji ego gọọmentị arụzi ụlọ ahụ. Mana Obieze gbara isiakwara ma mepee ogige ahụ nye ndị nlereanya iji nwete ego. Ezenwaanyị gbara egbe SA80 oge ọ gara nleta n'ụlọọrụ ndịagha Army Rifle Association na Bisley

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Mgbe Diana bụ Adaeze nke Wales nwụchara n'afọ 1997, ndị mmadụ karọrọ Ezenwaanyị maka apụtaghị n'ọha. Mana ọ na-abatara ozi iti aka n'obi n'ezi Obieze Buckingham ma gbasaa ozi na TV

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Ezenwaanyị sonyere Susan McCarron ṅụọ mmiri ọkụ (tea) n'ụlọ ha dị na Castlemilk, Glasgow, mgbe ezinaụlọ Onyeze mere ntule n'ụzọ ọzọ e nwereike iji enwe mkparịtaụka n'ọha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Na 2000, Nne Ezenwaanyị mere emume ncheta afọ otu narị ọmụmụ ya (100th birthday) - Ebe ya na ụmụ ya ndị nwaanyị Adaeze Margaret na Ezenwaanyị Elizabeth

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Na 2002, Ezenwaanyị zutere ọnwụ nwanne ya nwaanyị bụ Adaeze Margaret, na nne ya n'ime izuụka asaa.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ezenwaanyị nwetere nkwado dị ukwuu mgbe o mere emume nchekwa afọ iri ise ọ nọrọ n'ọkwa (Golden Jubilee). Ọtụtụt ndị mma gbakọtara ebe ahụ n'ọgbọ ezumezu na mgbede ahụ bụ 4 Juune afọ 2022.

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Na 2005, Ezenwaanyị Elizabeth hụrụ ka Ọkpara ya lụrụ nwaanyị nke ugboro abụọ. Ọkparaeze Charles lụrụ Camilla Parker Bowles n'emume e mere na Windsor Guildhall, nke ha natara ngozi n'ụlọụka St George's Chapel dị na Windsor Castle

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Elizabeth, di ya bụ Duke nke Edinburgh, Ọkparaeze Wales na Duchess nke Cornwall mgbe ha nọkọtara ọnụ n'egwuregwu Braemar Highland n'Aberdeenshire

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Na 2007 Ezenwaanyị nọ na-eze mmiri n'oge mgbape isiụlọọrụ ọhụrụ nke asọmpi Lawn Tennis Association na Roehampton

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Ezenwaanyị kpọrọ okwu Groucho Marx kwuru aha banyere ịka nka n'emume ncheta ọmụmụ afọ iri atọ a mụrụ ya. O kwuru: "Onye ọbụla nwereike ịka nka; naanị ihe i ga-eme bụ ibi ogologo ndụ"

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Otu emume kachasị nye ya obi ụtọ ka ọ na-aka nka bụ agbamakwụkwọ nwa nwa ya bụ Ọkparaeze William na Catherine Middleton n'afọ 2011. Lee Ọkparaeze William na nwunye ya ọhụrụ kpọọrọ Ezenwaanyị isiala

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Okpu Ezenwaanyị kaara ịdapụ mgbe o rutere na RAF Valley dị n'Anglesey mgbe ya na Ọkparaeze Philip gara ileta Ọkparaeze William, bụ onye e zigara n'ogige a n'oge ahụ.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Njem nleta o mere na Leicester na mbido njem nleta afọ iri isii ya ọ na-eme na mba UK na 2012
Nkọwa foto, Mgbe Ezenwaanyị pụtara n'ụzọ pụrụiche na mmepe emume asọmpi Olympics nke Lọndọn, n'ihe onyonyo ya na onye a ma ama bụ Daniel Craiga e jikwa James Bond maara.

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Ka afọ iri isii gachara ka ọ na-atara mmeri mbụ nke Royal Ascot dị ka onye nwe ya, ịnyịnya Ezenwaanyị ritere Iko Ọlaedo nke ugboro 207, nke a butere ọṅụ nye Ezenwaanyị na onye nchịkọta ya bụ John Warren

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, N'oge 17:30 BST ụbọchị 9 Sepụtemba afọ 2015, Elizabeth chịrị ụbọchị 23,226, awa 16 na nkeji 30 - karịa ọchịchị nne nne nne bụ Ezenwaanyị Victoria. N'ụbọchị ahụ ọ nọ na-agbape okporo ụgbọoloko ọhụrụ na Scotland

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Ezenwaanyị Elizabeth II na ezinaụlọ ya ndị ọzọ sonyere ya n'emume ncheta ụbọchị ọmụmụ ya n'ọnwa Juun afọ 2016 dịka ọ gbara afọ 90

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ezenwaanyị gara n'ihu n'ịrụ ọrụ ọha ya, oge ụfọdụ ọ na-eme nke a naanị mgbe Duke nke Edinburgh gbacharala arụkwaghịm. O kiriri ka ịnyịnya ya bụ Sparkler sonyere n'asọmpi Royal Windsor Horse show n'afọ 2018

Ebe foto si, Chris Allerton / SussexRoyal

Nkọwa foto, Ezigbo ọṅụ dị dị ka ezinaụlọ ya na-eto - Foto a gosiri ya na Duke na Duchess of Sussex, nwa ha nwoke Archie na nne Duchess bụ Doria Ragland.

Ebe foto si, PA Media

Nkọwa foto, Ọkparaeze Philip bụ di Ezenwaanyị Elizabeth II nwụrụ na 9 Eprelụ 2021, ka ọ gbachara afọ 99 ka ọ nọchara ọtụtụ iri afọ n'akụkụ ya. Foto ebe Ezenwaanyị nọọrọ onwe ya n'akwamozu n'oge ọrịa Covid-19 na-arị ibe ya elu.

Ebe foto si, Duchess of Cambridge

Nkọwa foto, Ezenwaanyị ha pụrụ ụmụ anọ, ụmụ ụmụ asatọ na ụmụ ụmụ ụmụ iri na otu

E nwere ndị nwe foto niile a.