Lee ihe mere n'agbamakwụkwọ Harry na Meghan Markle

Ụbọchị 19 nke ọnwa Mee bụ nke ndị mmadụ agaghị echefu ọsịsọ, maka na ọ bụ ụbọchị Ọkparaeze Harry lụrụ Meghan bụ onye na-eme ihe nkiri na mba Amerịka.

Ọlụlụ ha kpalitere ụka n'ụfọdụ ebe maka na nne Meghan bụ onye isi ojii. Nwaada a bụkwa onye ji afọ atọ tọ di ya.

Ọlụlụ Harry bụ 'Duke of Sussex' ga-eme Meghan 'Duchess of Sussex'.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Naanị nne Meghan bụ Doria Ragland bụ onye ezinaụlọ ya bịara agbamakwụkwọ ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọkparaeze Williams meere nwanne ya nwoke bụ Harry 'best man'

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Meghan ji ụmụaka mejuputa 'bridal train' ya kama onwe ụmụagbọghọ na-achịkọta akwa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọkparaeze Charles bụ onye dudara Meghan n'ebe a ga-ejikọ ya na Harry, bụ ihe nna Meghan kwesịrị ime

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Meghan bụ onye nwere ọbara isi ojii mbụ a na-alụbata n'ụlọ eze ndị Briten n'ime ihe ruru afọ 100

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Archbishop nke Canterbury bụ Justin Welby, jikọrọ ha abụọ ọnụ ma gbaa ha akwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọkparaeze Harry mere ihe a na-atụghị anya oge ọ gbanyere nwunye ya ọla (ndị be eze Briten anaghị agbakarị ọla)

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Harry mịchara nwunye ya bụ Meghan ọnụ ka ha pụtara n'ebe a kpọrọ West Door nke St George's Chapel dị na Windsor Castle

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Harry na Meghan ji ụgbọ ịnyịnya akpọrọ Ascot Landau nyapụ n'ebe ha gbara akwụkwọ na Windsor Castle

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ezenwaanyị Elizabeth na di ya bụ Ọkparaeze Philip bụ Duke nke Edinburgh anọọla n'ocheeze afọ iri isii na ise (65)

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọkparaeze Charles, nwunye ya bụ Camilla na nne Meghan bụ Doria Ragland ka ha na-apụta n'ụlọụka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọkparaeze William bụ diọkparanne Harry na nwunye ya bụ Catherine na nwa ha nwoke bụ ọkparaeze George so bịa agbamakwụkwọ a

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị echefughị nne Williams na Harry bụ Adaeze Diana nwụrụ n'afọ 1997

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, David Beckham na-agbabu bọọlụ na nwunye ya bụ Victoria so ndị ọbịa bịara agbamakwụkwọ a

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Serena Williams na-apịa tenis na di ya bụ Alexis Ohanian so ndị ọbịa bịara agbamakwụkwọ a

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onye ama ama bụ Oprah Winfrey so na ndị ọbịa bịara agbamakwụkwọ a

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ ndị mmadụ mere njem ịbịa hụ ka Meghan na Harry si agbamakwụkwọ ha pụta

Foto niile a si n'aka ndị Getty Images.