Arsene Wenger: Ahụ esichaghị Aubameyang ike
Ebe foto si, AFP
Onye nchịkọta ndị otu bọọlụ Arsenal bụ Arsene Wenger ekwuola na ahụ ike adịghị onye egwuregwu bọọlụ ha gotere bụ Aubameyang.
N;ihi nke a ọ gaghị adị ike ipụta na asọmpị nke mbụ ya na premier league otu Arsenal na Everton ga-agba echi.
Aubemayang denyere aka n'akwụkwọ na mbido izuuka a were si n'otu Germany bụ Borrussia Dortmund gafere na Arsenal.
Wenger kwuru na "anyi ga enyochaya ahụ were mata etu ahụ dị ya. Ahụ ọkụ n'ere ya, nke a mere ọjịghị nwe ike kwado maka eguwregwu a. Mụ na ndị na-ahụ maka arụ isi ike ga enwe nkwekọrịta maka ike ya"
Nke a bụ nke Wenger kwuru mgbe ndị ntaakụkọ gbara ya ajụjụ ọnụ, Ọ gwakwara ha ịhe oji gote Aubameyang.
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available
{{rankTranslation}}