Election 2019: Ka Inec n'ọwụwa-Anyanwụ si eke nkwụcha maka ntuliaka ọkwa gọvanọ

Ka Inec si akwado ntuliaka ọkwa gọvanọ n'ọwụwa anyanwụ.

N'Anambara steeti

Nkọwa foto, Ndị ọrụ ngo Inec n'Anambara steeti, na-achọ aha ha

Ụlọọrụ Inec dị n'Ọka, isiobodo Anambara Steeti, amalitela ikesa ngwaọrụ ndị kacha dị mkpa nakwa ndị ọzọ a ga-eji mee ntuliaka nke ndị nnọchiteanya n'ụlọomeiwu nke steeti n'ụbọchị Satọde.

Inec ji ụgbọala ndị FRSC were na-ekesa ngwaọrụ ha ga-eji eme ntuliaka na mpaghara dị iche iche n'Anambara.

A ga-echeta na Anambara Steeti agaghị esonye na ntuliaka maka ọkwa Gọvanọ nke afọ a bụ 2019.

Makana ntuliaka maka ọkwa Gọvanọ n'Anambara Steeti, e ji họpụta Willie Obiano, bụ nke e mere n'ụbọchị 18 nke ọnwa Nọvemba, 2017.

N'Abịa steeti,

Ka onye ntaakụkọ BBC bịara n'ụlọọrụ CBN bụ ebe a na-ekesa ngwaọrụ ndị Inec ga-eji mee ntuliaka, ndị uweojii gbara ebe ahụ gburu gburu.

Mana dịka onye ntaakụkọ anyị ahụ kwuru, e kweghị ndị ntaakụkọ bata n'ime ebe a nọ eke ya.

N'Imo steeti

Ụlọọrụ Inec dị n'Imo steeti amalitela ikesa ngwaọrụ a ga-eji mee ntụliaka na steeti ahụ.

Na mgbede ụbọchị isii n'ime ọnwa Maachị ka ha bidoro na-ahazi ya bụ ngwaọrụ n'usoro okpuruọchịchị dị iche iche tupu ebugawa ya ebe ahụ.

Nke a na-eme n'ụlọọrụ ụlọakụ ukwu nke Naịjirịa bụ CBN dị n'Imo steeti.

Onyeisi ụlọọrụ Inec n'Imo steeti bụ ọkammụta Chukwuemeka Ezeonu, kwuru na ha ahụla na ntuliaka nke ọkwa gọvanọ ga-ata ezigbo akpụ, ya mere ha ji akwado n'oge ka ihe gaa nkeọma ụbọchị ahụ.

Ọ gara n'ihu nyocha ngwaọrụ ndị ahụ mara ma ha ezukwara ezu.

N'Ebny,

Inec Ebọnyị steeti na ndị ọrụ ngo a kpọrọ "Ad hoc staff" na Bekee, na-enwe mkparịtaụka maka nkwado ntuliaka nke gọvanọ na ndị ụlọomeiwu nke steeti, ịkọwara ha ọrụ ha ga-arụ, na ebe e zipuru ha maka ya bụ ọrụ.

Ọkammụta Godswill Obioma bụ onye nọ n'isi mkparitauka a, sị na ọrụ ha dị ụzọ atọ; Wọọdụ, okpuruọchịchị na steeti.

Nkọwa foto, Ndị ọrụ ngo ga-arụ ọrụ ha na kọnstituensi 24 dị n'Ebọnyị, dịka Inec natarala akwụkwọ njirimara ga-enyere ha aka ịgagharị ụbọchị ahụ.

REC rịọkwara ndị ọrụngo a ka ha ghara iwe iwe maka akwụghị ụgwọ ha n'oge.

Ọ gwara ha na ha ga-eji aka ha dee akara ụlọakụ ha maka ịgbalahụ ọgbatauhie akwụghị ụgwọ n'oge.

Ọ malitere ịkpọpụta aha ha n'otu n'otu maka ime nke a nakwa ịgwa ha ebe ha ga-arụ ọrụ.

N'ụbọchi ise nke ọnwa Maachị, ka ụlọọrụ inec kpọrọ ọgbakọ ndị ọnụ na-eru n'okwu n'Ebọnyị steeti.

Ndị pati 38 nakwa ndị otu na-abụghị nke gọọmenti bụ ndị ga-enyocha ka ya bụ ntuliaka nke a ga-eme na mkpụrụ ụbọchị itoolu nke ọnwa Maachị ga-esi gaa, bụ ndị nke dị iri (10) bịara ya bụ ọgbakọ.

Nkọwa foto, Inec Ebonyi

Isiokwu Inec bụ na onweghi onye ọbụla ga-atụ vootu ụbọchị satọde na-ejighi igwe "smartcard reader".

Inec s na iwu a ga-akp ok n'n n'gb a

Mgbe ndị bịara ya bụ mkparitaụka jụrụ ajụjụ si, "ọ bụrụ na "smartcard reader" arụghị ọrụ, gịnị ka a ga-eme?", Inec zara sị na ndị ọrụ ha ga-ewete smartcard reader ọzọ were dochie nke mebiri emebi.

"Ọ bụrụ na nke ahụ ekweghi arụ ọrụ ahapụzịa ya ka ọ dịwa echi".

Inec sị na akụrụngwa e ji arụ ọrụ ga-ahapụ ụlọọrụ ha ụbọchi Wenezde (Maachị 6) gawa ulọọrụ ha dị n'okpuruọchịchị dị icheiche, bụ ebe ha ga-esi gawa na RAC ha ụbọchị Fraịde.

Chris Onugbogu nke ulọọru Inec Ebọnyị steeti sị na "nke a ga-ewezuga ọgbatauhie pụrụ idapụta makana e mee ngwangwa, emeghara ọdachị."

Akụko ndị ga-amasị gị: