APC Primaries: Eyigharịala nke Abia state

Aha onyonyo, Otu pati APC Abia steeti agbakọla aka họpụta Buhari maka ndọrọndọrọ ọchịchị 2019

Akụkọ na-eru BBC Igbo ntị na-akọwa na eyigharịrị ụbọchị ntuliaka imeụlọ APC n'Abịa steeti makana ndị otu ha si Abuja erutebeghi.

Onyeisi otu APC nke Abia steeti bụ Donatus Nwamkpa, kwuputara nke a ka ya na onye ntaakụkọ BBC kwuru n'ekwentị.

Ndị APC Abia steeti gbakọtara aka họpụta Onyeisiala Muhammadu Buhari dịka onye ha chọrọ ka ọ nọchite anya ha na ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019.

Ọkammụta Chris Nwamuo gụpụtara aha Buhari ebe ha na-eme ntuliaka imeụlọ taa n'Ụmụahịa, Abịa steeti.

Nkechi Nwogu bụ onye omeiwu nọchiteburu Abịa Sentralụ so na ndị isi a hụrụ kwaba okpu bịara n'ọgbakọ ahụ a nọ kpọpụta aha Buhari.

Nkọwa foto, Nwogu bịara ọgbakọ a n'agbanyeghi na ọ naghị azọ ọkwa na 2019

Nyerere Anyim so na ndị isi n'otu APC n'Abịa na ndị ọzọ gbakọtaranụ kwuru na Buhari dị ha mma n'obi, ma kwuo na ọ na-arụ ọrụ a hụrụ anya, sị ka ọ rụrụ gawa n'ihu.

Nkọwa foto, Nyerere na ndị otu APC ọzọ chọrọ ka Buhari zọọ ọkwa ọchịchị ọzọ

Akụkọ na-eru BBC Igbo ntị na-akọwa na anwụchiela ụfọdụ ndị butere ọgbaghara n'ọgbakọ ntuliaka imeụlọ APC.

Aha onyonyo, APC Primaries: Ọgbaghara dapụtara n'Enugwu

Na ọgbaghara dapụtara emeghi ka ndị mmadụ kwakọrọ lawa be ha, makana akụkọ kwuru na ntuliaka ndị mmadụ ji maka ya bịa ka ga-aga n'ihu.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ n'Enugwu steeti ugbua zitere foto a na-egosi na ntuliaka a ga-ebido n'oge na-adịghị anya.

Otụtụ ndị nche obodo pụtara maka ntuliaka a.

Nkọwa foto, Ndị nche a pụtara n'Enugwu
Nkọwa foto, Ndị ga-ebinye aka eruola ebe ha ga-eme ntuliaka a n'Enugwu

APC n'ime Kano steeti ebidola ntuliaka imeụlọ nke ha.

Ọtụtụ ndị otu ha apụtaala maka ntuliaka nke taa.

Nkọwa foto, Ndị otu APC na Kano

Ngwa ọrụ ha ga-eji were mee ntuliaka eruola wọọdụ dị iche iche na Kano maka ntụlịaka imeụlọ a.

Ngwa ntuliaka imeụlọ nke APC n'Enugwu steeti eruola ebe ha ga-eme ntuliaka a.

PDP dị njikere

Ọ bụghị sọọsọ APC na-eme ntụlịaka imeụlọ.

Ndị otu PDP agbakọọla n'Okpara square ebe ha ga-eme ntuliaka ha.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo na-ekwu na puku karị puku mmadụ bụ ndị gbakọrọ n'ebe ahụ.

Ka o si dị ugbua n'Enugwu, ha ka na-elebe anya n'akwụkwọ ka ha ma ndị ga-eso na ntuliaka nke taa.

Ndị otu APC apụtala na ọgbọ egwuregwu Adamasingba n'ime Ibadọn bụ isi obodo Oyo steeti.

Ha na-eche mgbe ha ga-ebido ịchọpụta ndị dere aha na akwụkwọ maka ntụliaka a.

Nkọwa foto, Ndị Oyo apụụla maka ntuliaka ime ụlọ a

N'Abia steeti, ndị otu PDP kwuru n'ịrọ ọgbọ egwuregwu nke Umuahia isi obodo Abia steeti ebe ha ga-eme ntuliaka imeụlọ nke steeti ha taa.

BBC Igbo na-ewete ozi na o nwere ndị ji akwụkwọ ikike adigboroja maka ntuliaka imeụlọ nke APC n'Enugwu steeti.

Ha ekweghị ka ha bata n'ebe a na-eme ntụlịaka a.

Nkọwa foto, Akwụkwọ ikike adigboroja

APC na-akọwa na nke a bụ nke bụ ezigbo akwụkwọ ikike ntuliaka imeụlọ nke APC.

Nkọwa foto, Nke bụ ezigbo akwụkwọ ikike

Akụkọ ka na-abịa.