You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụmụaka abụọ awụọla n'Ebonyi maka kerosene adigboroja
Ụmụaka abụọ awụọla n'Ebonyi
Ụmụaka abụọ anwụọla n'Ebonyi steeti maka mmanụ kerosene adigboroja dị n'ime mpanaka gbawara na bee ha.
Ha abụọ bụ nwanne na nwanne dị afọ asaa na afọ ise.
Akụkọ a kwukwara na ọkụ rekwa onye ọzọ nọrọ n'ụlọọgwụ ugbua.
Ndị uweojii ekwuola na ha emechiela ụlọọrụ rere mmanụ a.
Akwammiri adaala na Niger steeti.
Akukọ na-ekwu na akwammiri a nọrọ n'okporụzọ Mina na Bida dara maka nnukwu ozizo mmiri na-ezo ugbua na steeti ahụ.
John McCain ala!!
Ọrịa kansa egbuola otu Sinatọ ama ama nke ala Amerika aha ya bụ John McCain.
McCain dị afọ iri asatọ na otu oge ọ nwụrụ n'isi ụtụtụ taa.
N'egwuregwu
Aka na-achịkota otu egwuregwu Liverpool bụ Jurgen Klopp ekwuola na nnukwu ọrụ ka dị n'aka ya na-agbanyeghi na Liverpool meriri Brighton otu ọkpụ na-asataghị ihe.
Cheta kwa na Chelsea na Newcastle nakwa Crysal Palace na watford ga-asọmpị nke ha taa na Premier league.
Gee nkeji anyị nle ụtụtụ a
Lee ihe nkiri anyị