A nwuchiela ụmụakwụkwọ Igbinedion maka ebubo nwata akwụkwọ ibe ha ihe

Ebe foto si, Igbinedion Education Centre
Ndị uweojii Edo Steeti anwuchiela ụmụakwụkwọ Igbinedion Education Centre maka maka iti nwata akwụkwụ ibe ha ihe n’ n'ụlọakwụkwọ ahụ.
N’ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Steeti ahụ bụ Eno Ikoedem wepụtara n'ụbọchị Satọde, ọ sị na a ga-ekpe ụmụakwụkwọ ahu e boro ebubo jidela n'ụlọikpe ezinaụlọ dịka iwu na-achị amamikpe ụmụaka siri dị.
“Ụlọọru anyi emeela nnyocha zuru oke chọpụta na anyị ejidela mmadụ niile aka ha dị n’ihe merenụ, a ga-ekpe ha ikpe n'ụlọikpe ma-ahụ maka ezinaụlọ dịka iwu obodo siri dị maka amamikpe ụmụaka na nchekwa ụmụaka," ozi ahụ kwuru.
Ikoedem nyere mkpebi na ndị uweojii agaghị agbanwe n’idebe iwu nakwa ichekwa ndị bi na steeti ahụ niile, ọkachasị ụmụaka.
Cheta na ihe a mere n’izuụka gara, mgbe ihe onyonyo fesara na soshal midịa gosiri ebe ụmụakwụkwọ nwoke abụọ na-eti nwa akwụkwọ ibe ha ihe n'ụzọ dị egwu.
Ihe onyonyo ahụ na-akpasu iwe mere ka ndịisi ụlọakwụkwọ chụọ ụmụakwụkwọ ahụ tinyere aka n'ihe mmegide ahụ.






















