UK Visa: Lee ụmụakwụkwọ ndị mmachi mba a metụtara

Ụlọorụ mbịara mbịara nke mba Briten ekwuola na bido n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Jenụwarị afọ a, ụmụakwụkwọ ọhụrụ agaghịzi enweike ịkpọta ezinaụlọ ha na mba ahụ.

Nke a pụtara n'akara X bụbu Twitter ha n'ozi ha ziputere n'ụbọchị Monde.

"Ndị na-abịa ịgụ akwụkwọ nyocha dị na ya nakwa ndị ji onyinye gọọmentị agụ akwụkwọ esoghi na ndị iwu a metụtara" ka ha kwukwara n'ozi ahụ.

Nke a bụ mbido otu n'ime ụfọdụ iwu ndị ha gbanwere gbasara mbịara mbịara na mba ha nke ha chọrọ ịbelata.

Ihe ọzọ ha kwukwara ga-emetụta ụmụakwụkwọ bụ ị si n'akwụkwọ ikike agụmakwụkwọ banye n'akwụkwọ ikike ọrụ dịka o si dibu mbụ.

Ọ pụtara na onye ọbụla ji akwụkwọ nwata akwụkwọ ga-ebu ụzọ gụchaa akwụkwọ tupu ọ chọọ ịgbanwe akwụkwọ ikike ya.

Ọ bụghị naanị ụmụakwụkwọ ka iwu ọhụrụ ndị a ga-emetụta dịka mba Briten machikwara ndị ọrụ ahụike ịkpọ ezinaụlọ ha ịbịa were ọrụ na be ha.

Briten amapụtala amụma ịkpachi mbata ndị mbịarambiara

Gọọmentị mba Briten amapụtala amụma ga-eme ya o sie ike ndị mbịarambịara inweta akwụkwọ ikike ịbata mba dịka ọnụ,ọgụgụ ndị na-awụbata rirị elu.

Mịnịsta ha na-ahụ maka ihe na-eme n'ụlọ nke mba Briten bụ James Cleverly, onye gbara ama a kwuru na amụma ahụ nke nwere alaka ise bụ iji belata ọnụọgụgụ ndị mbịara bịara n nke o kwuru na 'Ọ dị nnukwu elu".

Mgbanwe ahụ gunyere ibuli ụgwọọnwa o pekata mpe nke ndị ọrụ si mba ọzọ ka ọ bụrụ agbata Paụsụ 26,200 na 38,700(£26,200 -£38,700).

Ego kwesịrị ịdị n'akpa ezinaụlọ chọrọ itinye akwụkwọ ikike ịbata rịkwara rue puku paụsụ iri atọ na asatọ, narị asaa( £38,700.)

Mr Cleverly sịrị na mmadụ narị atọ( 300,000) nwenwuru ịke ịbata mba UK afọ gara aga agaghị enweli ike ime ya n'ọdị n'ihu.

N'ozi nke o zigara ndị omeiwu, Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme n'ụlọ, kwuru na "ọ dị mkpa n'ọnụgụgụ ndị mbịarambịara gbadatara" ma kwụkwa na e nweela 'metọọ' ohere inweta akwụkwọ ikike ịbata maka ahụike na nleta ọtụtụ afọ.

Atụmatụ a na-abịa dịka ngụkọ e mere n'ọnwa gara aga gosiri na ndị mbịarambịara eruola 745,000 n'afọ 2022.

Ụfọdụ ndị omeiwu na-acha Praim Minista Rishi Sunak ọkụ ka o wetadata ọnụọgụgụ ndị na-abata mba Briten.