You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onyeisiala Tinubu bilie buo agha megide ogbugbu ndị mmadụ na Naịjirịa - Sịnetọ Abaribe
- Onye dere ya, Marvelous Obomanu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Onye Sịnetọ na-anọchiteanya Abia Saụt n'ụlọomeiwu Naịjirịa bụ Enyinnaya Abaribe akpọkuola Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ka o bilie ma buo agha megide ogbugbu ndị mmadụ.
Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, o kwuru na gọọmenti kwesịrị ibile bịa zọpụta ndị Naịjirịa, ma ọ bụ ndị ụka Kraịst, ndị Alakụba maọbụ ndị omenala na ọ bụ ndị mmadụ na-anwụ.
"Anyị na-akpọku gọọmenti Onyeisiala Bola Tinubu ka o bilie bịa zọpụta ndị Naịjirịa na-agbanyeghi maọbụ ụka Kraịst, ndị Alakụba maọbụ ndị omenala.
"Ihe kachasị mkpa bụ ndụ ndị mmadụ nke na-ala n'iyi.
O kwuru na e gbuola ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa ọ dịzie ka o nweghi ihe ndụ mmadụ bụ ma ọ dịzie ka ọ bụ nkụ ka a na-egbu na-edokọ ọnụ.
Kirie ihe o kwuru n'uju.