You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
City Boys/Village Boys ha ga-akpalite mmasị ndị ntoroọbịa ịtụ vootu
- Onye dere ya, Marvelous Obomanu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
Oge Naịjirịa mechara ntuliaka onyeisiala n'afọ 2023, ụfọdụ ndị ntorobịa gbajiri ma tufuo ikike e ji eme ntuliaka nke a na-akpọ 'Permanent Voter Card' n'iwe maka etu mpụtara ntuliaka ahụ sị dị.
Ufọdụ n'ime ha gosiri mwute ha maka na ntụliaka ahụ agaghị etu ha si chọọ n'ihi na onye ha bu n'uche enwetaghị mmeri nke mere ha ji kwuo na ha agaghị etinye ahụ n'ihe gbasara ntuliaka ọzọ.
Mana nke ahụ ọ gbanweela?
Dịka ọ na-adị mgbe ọbụla a na-akwado ime ntuliaka, ọtụtụ ndị otu nkwado ndọrọndọrọ ọchịchị ewelitewela isi ha elu iji dọta ndị Naịjirịa ka ha tụnyere ndị nke ha vootu.
E nwere otu nkwado abụọ na-ewu ewu ugbua karịsịa n'etiti ndị ntoroọbịa. 'City Boys' ya bụ otu na-akwado onyeisiala Tinubu nakwa 'Village Boys' otu na-akwado onye jibu Labour Pati zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 bụ Peter Obi.
Ihe anyị na-ahụ ugbua bụ na otu abụọ ndị a na-eji nwayọ nwayọ na-adọta mkpụrụobi ndị ntoroọbịa, nke mere anyị ji ajụ gị bụ onye na-ekiri anyị ụgbụa ma otu ndịa ha nwereike ịkpalite mmasị ndị ntoroọbịa ọzọ isoro tụọ vootu na ntụliaka afọ 2027?
Tinye ọnụ n'okwu a.