You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe mere gọọmenti Anambra Steeti jiri kụtuo otu ụlọ oringo dị n’Awka
Gọọmenti Anambra Steeti nọrọ n’ụbọchị Sọnde 29 Maachị, 2026, kụkpọọ ụlọ oriri na nkwari Airtight Guest House and Bar dị na mpaghara Y-Junction, Okpuno dị na Awka isiobodo steeti ahụ.
Nke a na-abịa dịka ndị ọrụ nchekwa Agunaechemba wakporo ebe ahụ ma chọpụta na ọgwụike dị iche iche, egbe nakwa ihe akaebe gosiri na ebe ahụ bụ ụlọ ndị akwụna.
Ndị ọrụ Agunaechemba nwụchiri Paul Chike bụ onye ọrụ n'ụlọ ahụ, ụmụnwaanyị iri atọ a na-eyo eyo na ha bụ ndị akwụna nakwa ọtụtụ ụmụnwoke ndị ọzọ.
Ihe ndị e nwetara n'ogige ahụ gụnyere egbe, ọgwụ Tramadol, na ọgwụike gụnyere igbo, nitrous oxide nke a maara dịka laughing gas, Rohypnol nakwa ọtụtụ ọgwụike ndị ọzọ.
Ken Emeakayi bụ onye ndụmọọdụ Gọvanọ Soludo n'ihe gbasara nchekwa ime obodo, kwuru na gọọmenti kụkpọrọ ụlọ ahụ maka na o metọrọ iwu Anambra Homeland Security Law..
Ọ kọwara na iwu ahụ nyere gọọmenti ikike ịkụkpọ ụlọ ahụ maọbụ ụlọ ọbụla a chọpụtara na e ji atụ mgbere ọgwụike maọbụ mpụ ọbụla.
Ọ gara n'ihu dọọ ndị nwee ụlọ ka ha mee nnyocha iji chọpụta onye maọbụ ndị ha chọrọ inye ụlọ ga-eji ụlọ ha mee.
Onyeisi ụlọ oriri na nkwari ahụ bụ Paul Chike kwuru na ọ bụ onye bịara dinaa ebe ahụ chezọrọ egbe ahụ ma kwuo na ha agbaala mbọ ịkwụsị ndị akwụna ịbịa n'ogige ahụ mana mbọ ha niile amịtaghị mkpụrụ ọbụla
Cheta na ụlọomeiwu Anambra Steeti mepụtara iwu Homeland Security Bill nke Gọvanọ Charles Soludo binyere aka na ya n'ọnwa Jenụwarị, 2025.
Iwu a bụ ebumnobi ya bụ ihiwe ndị ọrụ nchekwa a kpọrọ Agunechemba. Mana mpaghara 18 iwu ahụ kwuru okwu banyere ịmachi ime ọgwụ ego na steeti ahụ.
Iwu a kwuru na iwu megidere onye ọbụla ikwu na o nwere ikike pụrụiche, ebe onye ọbụla a nwụchiri maka nke a ga-egosi na ikike ya bụ eziokwu. Ọ bụrụ na o meghị nke, onye di etu a nwereike ịga ụlọmkpọrọ ruo afọ isii maọbụ kwụọ ego ruru nde iri abụọ maọbụ ha abụọ.
Cheta na gọọmenti Anambra steeti nwụchiri ma kpụpụ ọtụtụ ndị dibịa gụnyere Akwa Ọkụkọ, Onyeze Jesus na Eke-Hit n'ụlọikpe maka ebubo ime ọgwụ okeite nakwa ebubo ndị ọzọ.
Na nso nso, ndị ọrụ nchekwa Agunaechemba nwụchikwara dibịa ọzọ aha ya bụ Mmụọ Mmiri Afulanya nke mere ka ọtụtụ ndị na-eme omenala Igbo gbarụọ ihu maka nwụchi ahụ.