A na-achọ nwafọ mba Rọshịa achọ n'ebubo ikesa onyonyo mmekọ ahụ ya na ụmụnwaanyị Gana n'ịntanetị

    • Onye dere ya, Makuochi Okafor
    • Ndị mere akụkọ a, West Africa reporter
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Mba Gana na-achọ ka a gbaara otu nwafọ mba Rọshịa ụgbọ nwamkpi maka ebubo na o sere ihe onyonyo ebe ya na ụmụnwaanyị na-enwe mmekọ ma gbaa ya n'anwụ na-emeghi ka ha mata.

Ndị mgbasaozi mba Afrịka na Rọshịa kwuru na nwamadị ahụ bụ onye a ma na-esekaarị onwe ya na ndị ọzọ foto a kpọrọ "pick-up-artist" ma kesaa ihe o setere n'ịntanetị.

Nwamadị a dị ebe agbata afọ iri atọ gara njem na mba Gana na na-ese ihe onyonyo na nzuzo etu o si agbado ụmụnwaanyị mba Gana ma na-edina ha.

Ha kwuru na nwamadị a ji ugbegbe anya ya na-ese ihe onyonyo ndị ahụ ebe ya na ụmụnwaanyị na-enwe mmekọ ma kesaa ha na soshal midia, na-agbanyeghi ndị ọrụ gọọmenti ekwupụtabeghi ya.

Mịnịsta na-ahụ maka Tekịnụzụ na mba Gana bụ Sam George kwuru na ọ kpọkuola onye nnọchireanya mba Rọshịa ka ọ bịa ka ha kpaa maka ihe a mere.

O kwuru na ọ gwala onye nnọchiteanya ka o nyeere ụmụnwaanyị ndị a aka chọta ikpe ziri ezi. Mba Rọshịa anaghị akpọga nwafọ ha mba ọzọ ịzara ọnụ ma ọ bụghị okwu siri ike.

Mịnịsta na-ahụ maka ụmụaka na ụdịdị na Gana kwuru na nnyocha ha mere na mbụ gosiri na nwamadị ahụ esila na mba Gana pụọ.

Ma kwuo na nke a agaghị egbochi gọọmenti Gana ileba anya n'agwa ọjọọ nwamadị a kpara ma taa ya ahụhụ ruuru ya.

Mịnịsta George kwuru "Agwa nwafọ mba Gana a megidere iwu na-echekwa ịntanetị anyị."

"Anyị ga-achọ nwamadị a, anyị ga-eji akụrụngwa niile anyị nwere nakwa enyemaka ndị ọrụ nchekwa Interpol.

"Anyị ga-agwa mba Rọshịa ka ha kpọnye anyị nwamadị ahụ, anyị chọrọ ka a kpọlata ya na mba Gana ka ọ bịa zara ọnụ."

Ọ gara n'ihu kwuo na a ga-ama nwamadị ahụ ikpe n'azụ ma ọ bụrụ na ọ lọghachịghị na Gana.

Akụkọ kwuru na nwamadị a mekwara ihe dị etu a na mba Kenya.

Iwu mba Gana nke a kpọrọ 'Cybersecurity Act 2020' kwuru na onye ọbụla kesara ihe onyonyo mmekọ ahụ ụmụaka maọbụ okenye na-emeghi ka ọ maara ga-aga mkpọrọ ihe ruru afọ iri abụọ na ise.

A nwuchiel ọtụtụ mmadụ banyere ịda ụdịrị iwu na nso nso a.

N'afọ 2022, ụlọikpe maara onye na-arụzi ekwenti bụ Solomon Doga dị afọ iri abụọ na abụọ ikpe ma tụọ ya nga afọ iri na anọ maka ikesa foto ebe otu nwaanyị mba Lebanon gbaa ọtọ.