Davis Offor na-eme ejije a ma dịka 'Clarus' anwụọla n'afọ 85
Ebe foto si, Tony Akposheri/Facebook
Onye mere ejije na Nollywood n'oge ochie bụ Davis Offor a ma ama dịka 'Clarus Mgbeojirikwe' n'ihe nkiri "New Masquerade" nke afọ 1980, anwụọla dịka ọ gbara afọ iri asatọ na ise.
Onye omee ejije ibe ya bụ Tony Akposheri, wepụtara akụkọ ọnwụ ya n'akara soshal midịa ya n'ụbọchị Tuzde 7 Eprel 2026.
Akposheri bụ onye a maara dịka Zakky ihe ejije New Masquerade kwuputere oke mwute na obi mgbawa gbasara ọnwụ ya.
"Taa, obi m jọrọ m njọ n'ezie. Davis Ofor, onye anyị ji ịhụnanya kpọọ Clarus n'ihe nkiri 'New Masquerade', agafela n'ụwa ọzọ. Anyị na ya banyere n'afọ ọhụrụ a n'aṅụrị, na-achị ọchị ma na-akparịtaụka, ma na-atụ anya ọdịnihu dị mma.
"Anyị kwukọrịtara okwu banyere ndụ, banyere ebumnuche anyị, na otu anyị siri gbalite. Ma ọ dịghị onye n'ime anyị maara na oge gị agwụla n'ụwa a," ka o dere n'ozi ahụ.
N'ime ihe nkiri 'The New Masquerade', Clarus rụrụ ọrụ dịka nwa odibo. Ejije ya pụrụ iche nke tọrọ nde mmadụ lelere ihe nkiri ahụ ụtọ n'afọ ndị dị na 1980 na 90.
Isi akụkọ
Kọwaara m isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available