Oge eruola mgbe ala Igbo ga-enweta ọdọụgbọmmiri - Cosmas Maduka

Aha onyonyo, Oge eruola mgbe ala Igbo ga-enweta ọdọụgbọmmiri - Cosmas Maduka
Oge eruola mgbe ala Igbo ga-enweta ọdọụgbọmmiri - Cosmas Maduka

Cosmas Maduka bụ onye oji ego achụ nta ego a ma ama na Naịjirịa nwere ụlọọrụ na-azụ ahịa ụgbọala bụ nke a mara dịka Coscharis Motors akọwaala uru ọbara n'ụmụaka Igbo isonye na-imepe obodo ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

Na mkparịtaụka pụrụ iche ya na BBC News Igbo nwere, o kwuru na oge eruola mgbe ala Igbo ga-ewere akụ anyị n'ụlọ maka na anyị tinye akụ n'ụlọ.

Ọrụ adị n'ụlọ, ohi apụọ, ama alaa, ndị mmadụ enwee ebe ha na-aga n'ụtụtụ. Ọ bụ enweghị ihe a na-eme na-akpata mbigharị aka."

"Ekwere m na ụmụaka Igbo, Chineke agọziela anyị mana anyị kwesiri iwere akụ anyị ụlọ ma dozie be anyị maka na mmadụ na-esi n'ụlọ adị mma wee pụọ ama. Ka anyị laruo ụlọ.

"Ụdị akụ anyị na-eweru ụlọ ugbua bụ ije rụọ ụlọ mana o nweghị azụmaahịa na-akwado ụlọ ahụ. Ụlọ a dịrị, ngwere na oke a na-ebi na ya ruo mgbe anyị ga-alọta," ka o kwuru.

Maduka kwuru na ọ bụ maka nke a mere ụlọọrụ ya jiri gaa n'Anaku n'ime afọ iri atọ gara aga wee zụta ala ruru hekta puku atọ '3,000 hectare' ebe anyị na-akọ osikapa bụkwa nke anyị na-ebuga n'igwe 'mill' anyị ebe a na-esupụta ya, tupu anyị e bupụta ya n'ahịa.

Ọ gara n'ihu kpọ oku ka ndị gọọmenti nyere aka, site na ị site n'Abịa Steeti ruo n'Ugwuta n'Imo Steeti, gwọchaa osimiri 'Ugwuta Lake' iji rụpụta ọdọụgbọmmiri.

"Ihe kpọtara anyị niile na Legọs bụ ọdọụgbọmmiri. Ebidoro m azụmaahịa na Nnewi. Oge ahụ bụ na Pọta Kọtụ ka anyị si atụbata ahịa. I jee ibubata ahịa oge ahụ, ahịa gị ga-anọ ọnwa atọ maọbụ abụọ mana ọ bụrụ n'ọdọụgbọmmiri dị na Legos ka isi ebubata ahịa, ị ga-eburu ngwaahịa ahụ ụbọchị ahụ ọ batara," ka Maduka kwuru.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụrụ na gọọmenti rụpụta ọdọụgbọmmiri n'ala Igbo, ike maọbụ 'monopoly' Legọs nwere n'akụnaụba Naịjirịa ga-agwụ.

Ọ kọwara "Mmadụ a mara na e nwere nhọrọ, ndị Legọs agbabazie mbọ ma na-ayọzi ndị na-azụ ahịa ka ha nnọrọ n'obodo ha. Maka ha ma na e nwere ebe ọzọ ndị na-azụ ahịa ga-esi buru ngwaahịa ya."

Dịka o siri kuo, ọ bụ ndị gọọmentị ga-ahụ na enwere akụrụngwa.

"O nweghịkwa ihe dị njọ ma Soludo gwa Gọọmenti Etiti ma nwee nkwekọrịta ka ha kpọba ndị Chaịna ka ha agwọcha osimiri 'River Niger' nke ga-eme ka e nwee ọdọụgbọmmiri na Ọnịcha. Nke a ga-atụghapụ akụnụba Naịjirịa, ọ gaghị abụzi akụnụba Legọs kama ọ bụrụ akụnụba Naịjirịa."

Maduka kwupụtara nwute na Naịjirịa niile ga-agbakọ na-asị ka a chọta onye ga-edu anyị, ndị anyị na-akpọpụta egosi ụwa na ọ bụ onye ahụ bụ ọkacha mara abụrụ ihe ihere nyere anyị maka na anyị achọghị ịgwa onwe anyị eziokwu.

O kwuru na o nweghị ihe ga-agbanwe na Naịjirịa ma enweghị ezigbo onyendu maka na onweghị ebe Naịjirịa ji azụ eji maka ihe niile nọ n'ụwa na-ebido n'ọchịchị ma nkwụsịkwa n'ọchịchị.

"O nweghị ihe ga-adị mma ma enweghị ezigbo onyendu, o nweghị ihe a ga-arụ ma enweghị ezigbo onyendu. Ihe niile na-amalite ma nkwụsị n'ọchịchị," ka o kwuru.

Maduka kwupụtara uche ya banyere ndị na-efe mmadụ ego isi n'ọgbakọ.

Dịka o siri kwuo: "Ebe anyị siri bịa n'ala Igbo, anyị anaghị asọpụrụ ego. Ihe anyị na-asọpụrụ bụ amamihe na ịgba mbọ na ịlụsi ọrụ ike. Ọ bụrụ na anyị amaghị ebe i siri kpata ego, anyị agaghị enwe nsọpụrụ n'ebe ị nọ, anyị agaghị eri ego gị.

"Oge anyị dị obere, anyị anaghị eme emume ebe a na-efe mmadụ ego, na-emegịde ndị enweghị ma na-asị na ego bụ mmiri. Anyị ma na ego dị n'okwu na ọ naghị ehu ka mmiri," ka ọ gbankwụnyere.

"Agwara m ndị na-eto eto n'otu n'ime ihe ha ga-eme iji kpata ego bụ mmadụ idebe ụgwọ ọrụ ya n'oge ọdịnihu bekee kpọrọ 'deferred gratification' site na inwe ndidi ruo mgbe ị chọtara ihe ị na-achọ.

"Ọtụtụ ihe na-eme na be anyị bụ onye kpazie ego ọ na-eme kpọtụ. Onye hụ chịchị ọ na-eme kpọtụ maka na onye kpatara ego anaghị eme nkpọtụ. A gaghị ahụrụ ha ụzọ. Ọ kpọrọ ndị uweojii o tinye n'ụgbọala. O nwere koboko na-apịa ndị mmadụ. A baịa n'ebe a na-eme emume a na-efe ego n'isi ndị mmadụ. Asị m na mụ anaghị eme ya.

Skip Kirie akụkọ gbasara ọdụ ụgbọmmiri Ọnịcha and continue readingKirie akụkọ gbasara ọdụ ụgbọmmiri Ọnịcha

End of Kirie akụkọ gbasara ọdụ ụgbọmmiri Ọnịcha

Ọ kọwara na ya ejekatabeghị na Japan, Amerịka na Jamini maọbụ mba niile ya mara hụ ebe a na-efe mmadụ ego n'isi.

"Ọ bụ omenala dị anyị bi be ha, kwa Fraịde. Anyị bụrụ ọ mụta ọ gbakarị na-atụ akpa ego n'elu. Ọ bụghị ihe e jiri zụọ anyị. Ọ bụghị ihe kwesiri ekwesị," o kwuru.

Ọ gara n'ihu kwuo na ya mechara chọpụta n'ihe na-ewu ewu n'obodo na ihe ọhụrụ na-amasị ndị na-eto eto bụ na ihe ahụ anyị na-akpọ ime kpọtụ maọbụ ka ahụta ha 'attention seeking' bụ ego ọhụrụ nke kpatara na onye taa banana o see onwe ya foto ma tinye na soshal midịa.

Na nghọta nke m, ego ọhụrụ bụ ntụkwasị obi. Mmadụ ọ tụkwasịrị obi na gị? Kwere na ihe ị na-ekwu bụ eziokwu?

Lee ihe Cosmos Maduka kwuru maka ndị Igbo na ọchịchị Naịjirịa

N'okwu gbasara ndị Igbo iwere ọchịchị Naịjirịa, Madụka bidoro jụwa na "gịnị Naịjirịa achọghị iji ihe Chineke nyere ha?"

Ha sị na ọ bụrụ na ị họrọ ndị Naịjirịa ise maọbụ isii tịkọọ ha ọnụ, tinyekwa onye Igbo, tupu ị mara ihe na-eme, onye Igbo a bụrụ onyeisi ha.

Ọ bụ ihe mwute na a kpọ izu ịchọta ndị ga-edu Naịjirịa mana ndị anyị na-akpọpụta idu anyị bụ ihe ihere.

O nweghị ihe ga-agbanwe na-abụghị na e nwere ezigbo onye ndu. Azụ anaghị emebi site n'ọdụ. Azụ na-emebi site n'isi.

Naịjirịa achọghị mgbanwe.