Igbo Culture: Gịnị bụ Ikoro na uru ọ bara n’omenala Igbo?
- Onye dere ya, Ikechukwu Kalu
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Ebeg o si, Lagos
N’oge gboo n’ala Igbo, mgbe elu ka bụ ala ọsa, e nwere ụfọdụ akụrụngwa ụda ndị Igbo ji agbasa ozi n’obodo nke gụnyere, ekwe, udu, ogene nakwa Ikoro.
Akụrụngwa ndị a nwere ihe mere ha jiri dị iche n’ibe ha, site n’ụda ha, etu ha n'ukwuu nakwa ihe ndị ọzọ.
N’akụkọ a, anyị ga-elebe anya n’ihe banyere akụrụngwa pụrụiche a na-akpọ ‘Ikoro’.
Ihe bụ ikoro
Otu onye ọkachamaara n’omenala Igbo bụ Nze Duruagwu bụ akụrụngwa ụda e ji akpọku ọha mmadụ n’obodo ma oke ihe mee – ma nke ọma ma nke ọjọọ.
O kwuru na ụda ikoro na-ama jijiji n’obi nke bụ na a kụọ ya, onye ọbụla nọ n’obodo ga-anụrịrị ụda ya na-agbanyeghi ebe ị nọ.
Nze Duruagwu kwuru na e nwere ụfọdụ obodo ikoro ha na-ebu oke ibu nke bụ na tupu a kụọ ya, a na-eji ubube arịgoro n’elu ya.
“Ikoro dịka arụnsị, a na-atụrụ ụfọdụ n’ime ha aja tupu a kụọ ya. A na-arụrụ ikoro ụlọ, ọ na-anaghị anọ n’okpuru anwụ maọbụ mmiri.”
Duruagwụ kwuru na ọ bụghị mmadụ niile nwereike ịkụ ikoro na onye ahụ na-akwado ọfụma tupu ọ kụọ ikoro.
“Ọ bụghị onye ọbụla nwereike ịkụnwu ikoro, ịkụ ikoro na-esi n’agbụrụ, onye ahụ ga na-asọ ime ihe ọjọọ nsọ.”
“A na-anaghị akụ ikoro na nkịtị ma o nweghi nnukwu ihe dapụtara maọbụ ozi dị mkpa a chọrọ izi ndị obodo.
“Mgbe ọbụla a kụrụ ikoro, ndị obodo niile na-agbakọta n’etiti ama, iji chọpụta nnukwu ihe ahụ mere nụ.
Ihe e ji ikoro eme n'obodo
Nze Duruagwu tụrụ ilu sị “ọ na-abụ ekwe kụọ ama agbaa”. O kwuru na ọ bụ ikoro ka e ji eme ihe ndị gụnyere;
- Ịkpọku ọhanaeze obodo ma oke ihe mee maọbụ a chọro ime nnukwu emume n’obodo dịka ichi Eze, Nze na Ọzọr.
- A na-eji ya ekwupụta ọnwụ nnukwu mmadụ n’obodo dịka ọnwe Eze obodo, ọnwụ onye Ichie, Ezemmụọ na ndị ọzọ.
- A na-eji ya akpọ oku agha n’oge gboo.
- E nwereike iji ikoro kpọpụta nnukwu mmọnụ n’obodo, mgbe ahụ a kụọ ya, a na-esi nwaanyị ọbụla maọbụ onye na-etozughi oke ịhụ mmọnwụ ahụ agaghị apụta ezi.
Ndịiche dị n’Ikoro na ekwe
Nze Duruagwụ kwuru na ọ bụ eziokwu na e ji ikoro na ekwe agbasa ozi mana e nwere ndịiche n’etiti ha.
Ikoro buru nnukwu ibu anaghị ebu ya akpagharị akpagharị mana ekwe dị obere.
A na-atụrụ ụfọdụ ikoro aja tupu a kụọ ya mana a naghị atụ aja n’ịkụ ekwe.
Ịkụ ikoro na-esi n’agbụrụ anaghị a họpụta onye ahụ ahọpụta mana e nwereike ịhọpụta onye na-akụ ekwe.
Ihe mere omenala ikoro ji anwụ
Dịka ọ dị ugbua, omenala iji ikoro agbasa ozi maọbụ ịma ọkwa na-anwụzi anwụ n’ala Igbo ugbua.
Nze Duruagwu kwuru na ihe butere ọnọdụ a gụnyere mbata omenala nwa Bekee butere okpukperechi Kraịst nke mere na ọtụtụ ndị Igbo anaghizi ekwenye n’omenala Igbo.
O kwuru na o meela ụfọdụ na-akpọzi ụlọ ikoro ndị a ọkụ na-emebisi ha, ebe ndị oke ọchịchị na-ezu ikoro ndị a ma na-ere.
Ihe ọzọ bụkwa na tekịnụzụ ọgbara ọhụrụ emeela ka nzirita ozi maọbụ ịma ọkwa lazie n’ekwentị nke mere na ọ na-arahụ ịhụ ka ndị obodo niile gbakọtara ọnụ maka mkparịtaụka.
Duruagwụ tụrụ arọ kwuo na ọ ga-adị mkpa ka ndị Igbo legharịa anya azụ ma chọpụta ebe ha si ma makụọ ụfọdụ omenala ndị ha gbahapụrụla bụ nke ikoro so n’ime ha.
Isi akụkọ
Akụkọ akachasị gụọ
Content is not available