You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kedụ uru ose bara n'ahụ mmadụ?
- Onye dere ya, Uzoamaka Ewuzie
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
- Ebeg o si, Legọs
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5
Ose bụ ngwa e ji esi nri na-abịa n'ụdị dị iche iche, jupụta n'akụrụngwa dị iche iche ma na-afụ ụfụ na nrị.
Ose bụkwa ngwa e ji enyere ụtọ nri aka.
E nwere ose ojii, ose odo, ose uhie, ose na-afụ ụfụ Bekee kpọrọ 'chilli' nakwa ose na-adighị afụ ụfụ a kpọrọ 'non chilli'.
Ndị nchọcha kwuru na ụfọdụ ndị bi n'ọtụtụ mpaghara mba Amerịka gụnyere Alaska, Dakota na ndị ọzọ ejighị ose na-efụ ụfụ eme ihe ọbụla.
Ma n'Afrika ebe a, anyi na-eji ose na-afụ ụfụ eme otutu ihe. Ndị seyensị nwere ọtụtụ aha ha jiri mara ose nke gụnyere Capsicum Annuum, Pipeer Guineense, na Pipeer Nigrum.
Etu e si eji ose esi nri
Ụfụdọ mmadụ na-etinye ose na nri ha oge ọ ka dị ndụ, ya bụ mgbe agwakọtara ya n'ụdị mmiri mmiri tupu etinye ya na nri.
E nwere ike ichekwa ose n'okpuru anyanwụ tupu akwọpịa ya ka ọ bụrụ ntụ, karịsịa ose ojii bụ nke e ji mara ụmụafọ Gana na Kameruun.
A na-echekwa obere ose na-acha uhie uhie n'okpuru ihu anyanwụ tupu akwọpịa ya ka ọ bụrụ ntụ. A na-eji ụdịrị ose ndị a esi nri.
Onye ọkachamara n'ihe banyere ahụike bụ Dọkịta Solomon Kelechi Nwafuru gwara BBC News Igbo na ose e ji ikuku mịkpọọ ebe enweghị ihu anyanwụ kpọmkwem, ga-akacha enye ihe n'ahụ mmadụ, karịa ose a mịrị amị n'okpuru ihụ anyanwụ kpọmkwem.
Dọkịta Nwafuru kọwara na mgbe ọbụla mmadụ mịkpọrọ osisi, mkpụrụ osisi maọbụ akwụkwọ nri n'okpuru ihu anyanwụ, ọtụtụ ihe na-edozi ahụ dị n'ime ya ga-apụ maọbụ kpochapụ n'ihi mmetụta nke ihu anyanwụ nwere na ya.
O kwuru na ụfọdụ akwụkwọ nri anaghị achọ mmetụta nke ihu anyanwụ maka na ọ na-ebelata ihe mejupụtara ya na ngwa dị mkpa nke ahụ chọrọ maka uto na ọrụ ndị ọzọ na-edozi ahụ.
Ọtụtụ ndị mereela nnyocha banyere ose gụnyere Dagnoko et al., 2013 na Hammeed et al., 2022. Ha kwuru na ose nwere ngwa kemịkalụ Bekee kpọrọ 'antioxidant' dịka vitamin C maọbụ E nke na-ewepụ ihe ndị nwereike imebi nri e chekwara n'ahụ mmadụ.
Ndị ọkachamara kwuru na ose nwere ọtụtụ akụrụngwa n'ime ya, nke gụnyere vitamin, mineral, alkaloid na ihe ndị ọzọ dị iche iche.
Nwafuru kwuru na ọ bụ ngwa ndị a ose nwere ka ahụ mmadụ chọrọ maka ịrụ ọrụ ahụ na-arụ kwa ụbọchị.
Gịnị ka ose na-eme n'ahụ mmadụ n'ezie?
Dọkịta Nwafuru kwuru na ose nwere ngwa 'alkaloid' nke na-akwụsị ahụ mgbu ma na-akpalite ọgwụgwọ ọnya n'ahụ.
Ọ kọwara na ọ bụrụ na mmadụ erie ose mgbe ọ na-enwe isi ọwụwa, ose ahụ ga-ewepụta ngwa a na-akpọ 'Capsaicin' iji mee ka isi ọwụwa onye ahụ dajụọ site n'ịkwụsị ihe ndị na-akpalite isi ọwụwa ahụ.
"Ose nwekwara ihe mgbochi dị ire nke na-ebibi nje a naghị ahụ anya bụ 'microorganism' nke na-ebute isi ọwụwa dịka nje 'bacteria', maọbụ parasaịti iji nye ahụ gị ndajụ ahụ ị chọrọ," ka Dọkịta Nwafuru kọwara.
Dịka o siri kwuo, "Ose na-eme ka mmepụta mmiri e ji akpụ nwa dị n'ahụ nwoke na-abawanye site n'ịbawanye ọbara na-eruba n'ahụ ma na-enyekwa aka na nkeli ahụ nwoke. Ọ dị mma ka ụmụnwoke na-eri ose mgbe ọbụla," ka o kwuru.
O kwuru na ose na-ebelata ahụọkụ ma na-ebelata oke abụba iji zere oke ibu ma na-emekwa ka ọrịa shuga beleta n'ahụ mmadụ.
"Ose na-asachapụkwa usoro mgbari nri nke pụtara na onye nwere afọ ntachi nwereike iri ose iji nwere onwe ya."
Ose na-enye aka na-asachapụ akụrụ, imeju na imeziwanye ọrụ uche, na-abawanye ọgụgụ isi. Ọ na-enyere ndị mmadụ aka ihi ezigbo ụra, na-abawanye mgbochi ahụ gị, na-abawanye mmepụta mmiri ara n'ahụ nwaaanyị mụrụ nwa ọhụrụ.
Ose na-ebelata ọbara mgbali elu site n'ime ka ọbara na-aga n'ahụ nke ọma ma na-ewepụ ihe mgbochi na-eme ka ọbara ghara ịgafe n'akwara nke ọma.
Ose na-ebelata mgbu na nkeji ọkpụkpụ bụ 'arthritis'.
Onye nwere ọrịa onya afọ 'ulcer' o kwesịrị iri ose?
Ka o si dị, e nweela ọtụtụ mgbagha banyere etu iri ose si emetụta onye nwere ọrịa ọnya afọ nke Bekee kpọrọ ucler.
Mana Dọkịta Nwafuru kọwara na iri ose na-agwọ ọnya afọ maọbụ ọnya eriri afọ.
"Ọ bụrụ na i rie ose, ọ ga-aga na ọnya ahụ wee kpasuo ya iwe nke ga-eme ka afọ malite ịfụ onye ahụ ụfụ maọbụ onye ahụ wee malite inwe ahụ mgbu. Onye ahụ nwereike ikwu na ose ahụ na-eme ka ọrịa ucler ahụ kawanye njọ mana ọ bụghị eziokwu n'ihi na mgbe ahụ mgbu ahụ gasịrị, ọnya ahụ ga-ajụrụ oyi mgbe ahụ ọgwụgwọ ga-ewere ọnọdụ," ka ọ kọwara.
Mana mgbe onye nwere ọnya afọ kwụsịrị iri ose n'ihi na ọ na-eme ka ọnya afọ na-afụ ya ụfụ, ọnya ahụ ga-amalite ịbawanye n'ihi erighị ose.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ ụzọ ihe abụọ na-akpalite ọrịa ọnya afọ nke gụnyere nje microorganism na nke abụghị microorganism.
Ọ kọwara na ọnya afọ nke microorganism bụ nke nje 'bacteria' na-akpalite, ebe nke abụghị microorganism na-amalite site na ịṅụbiga mmanya ọkụ oke, ise anwụrụ ọkụ, agụụ na-agụ mgbe niile, iri nri na-esi isi ụtọ, iri oke nri arụrụ arụ ya na ịṅụbiga ọgwụ ahụ mgbu oke.
O kwuru na ose na-arụ ọrụ abụọ n'ahụ onye nwere ọrịa ọnya afọ.
Na mbụ ose na-ebibi nje 'microorganism' nke na-emepụta acid ma na-eme ka ọnọdụ ọnya ahụ dịkwuo njọ.
Nke abụọ, ose na-enyekwa ihe ndị ahụ pụrụ n'ahụ mmadụ mgbe ọnya ahụ dị n'afọ ma mee ka ọgwụgwọ malite na-ewere ọnọdụ.
Ose anaghị eme ka ọnya afọ na-akawanye njọ n'ihi na ọ na-ewepụta vitamin na-enye aka ịgwọ ọnya dịka ọnya afọ bụ ucler.
Nwafuru kwuru na ose bụ otu n'ime ihe kacha mkpa Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile kere n'ụwa.
Ọ gbakwunyere na agbụrụ ndị dịka Kameruun, Togo, Gana na ndị ọdịda anyanwụ Naịjirịa na-eri ose nke ọma kachasị ebi ogologo ndụ karịa ndị anaghị eri ose nnukwu.