Anyị agaghị anabata mpụtara ọgbakọ ọbụla ADC mere - Onyeisioche Inec

Anyị agaghị anabata mpụtara ọgbakọ ọbụla ADC mere - Onyeisioche Inec

Onyeisioche Independent National Electoral Commision (Inec) bụ Joash Amụpitan, ekwuola kpọm kwem na Inec agaghị anabata mpụtara nnukwu ọgbakọ National Convention ọbụla African Democratic Congress (ADC) mere ruo oge ụlọikpe kpebiri ikpe esemokwu ahụ banyere onye bụ onyeisioche ADC.

O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ Arise News nwere na nso nso banyere nkagbu ụlọọrụ Inec kagburu aha David Mark dịka onyeisioche pati ADC.

Banyere ebubo ADC boro na ọ bụ gọọmenti etiti na-akwado Inec ka ha tinye ọgbaaghara na pati ha, Amupitan kwuru nae bubo ahụ abụghị eziokwu ma ncha.

O mere ka o doo any na Inec bụ ụlọọrụ na-erube isi nye iwu nakwa mkpebi ụlọikpe ma kwuo na Inec enweghị atụmatụ ọbụla ime ka Naịjirịa nwee naanị otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị.

Gịnị butere esemokwu a?

Nafiu Bala bụ onye kpụpụrụ ADC n'ụlọikpe ma kwuo na ọ bụ ya kwesịrị ịbụ onyeisioche pati ADC dịka Ralph Nwosu bụbu onyeisioche ADC gbara arụkwaghịm na Julaị 2025. Oge Ralph Nwosu bụ onyeisioche ADC, Nafiu Bala bụ osote ya.

Mana oge Atiku Abubakar, Peter Obi na ọtụtụ ndị ọzọ batara ADC na Julaị 2025, Nwosu nyefere ọkwa onyeisioche pati ADC n'aka David Mark.

Ọ bụ nke a mere ka Nafiu Bala gbaa ha akwụkwọ n'ụlọikpe ma kwuo na ọ bụ ya kwesiri ịbụ onyeisioche ADC.

N'aka nke ọzọ, onyeisi mgbasaozi pati ADC bụ Bolaji Abdullahi, kwuru na Nafiu Bala gbara arụkwaghịm na pati ADC kemgbe abalị iri na asatọ nke ọnwa Mee, 2025.

Cheta na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị isi kara aka họpụtara ADC n'ọnwa Julaị 2025 dịka 'coalition party' n'olu bekee iji napụ ọchịchị n'aka Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu nke All Progressive Congress (APC) na ntuliaka n'afọ 2027.

Ihe pati ADC kwuru

Ka o si na dị, African Democratic Congress (ADC), ekwuola na ha ga-aga n'ihu mee nnukwu ọgbakọ 'National Convention ha n'ụbọchị Tuzde 14 Eprel, 2026 n'agbanyeghị na Inec kagburu aha ndịisi otu National Working Committee ha gụnyere onyeisioche ha bụ David Mark, odeakwụkwọ ha bụ Rauf Aregbesola na ndị ọzọ n'akwụkwọ ha maka ikpe ahụ dị nọ n'ụlọikpe.

ADC kwuru na o doro ha anya na ọ bụ gọọmenti etiti na-akwanye Inec ọkụ n'ike ka ha tinye nsogbu na pati ADC maka na ha ahụla ọtụtụ nkwado ndị Naịjirịa na-enye ha dịka ntuliaka afọ 2027 na-akpọdobe nso.

Lee usoro ADC wepụtara banyere nnukwu ọgbakọ ha:

  • Nnyocha ndị ga-azọ ọkwa - Eprel 7
  • Mkpesa banyere nnyocha ndị na-azọ ọkwa -Eprel 8
  • Ọgbakọ wọọdụ na nke okpuru ọchịchị - Eprel 9
  • Mkpesa banyere ọgbakọ okpuru ọchịchị - Eprel 10
  • Ọgbakọ Steeti - Eprel 11
  • Mkpesa banyere ọgbakọ steeti - Eprel 12
  • Nnukwu ọgbakọ kọnvenshọn - Eprel 14