Onye ga-abụ eze ga-akwụ ọtọ na ntuliaka ọkwa gọvanọ Ebonyi Steeti?

Ọ fọla ụbọchị atọ tupu ndị Ebonyi Steeti enuputa n'igwe ịhọpụta onye ga-anọchi Dave Umahi dịka gọvanọ ha.

Mmadụ iri na-atọ na-azọ ọkwa gọvanọ n'Abia Steeti, nke ọbụla n'ime ha na-ekwe nkwa iweta mmepe na steeti ahụ nakwa ịkwalite ọdị mma ndị mmadụ.

Lee ndị na-azọ ọkwa gọvanọ n'Ebonyi steeti:

Ebe foto si, Odii/Francis/Odoh/Awuregu/Facebook

Nwifuru Francis Ogbonna - APC

Ebe foto si, Nwifuru Francis Ogbonna

  • Ọ bubu onyeisi ụlọ omeiwu Ebonyi steeti ruo afọ asatọ, ebe ọ nọchitere anya mpaghara Izzi West.
  • Ọ dị afọ 48
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Ebonyi Steeti

Odoh Benard - APGA

Ebe foto si, Odoh Bernard/Facebook

  • Ọ bụbu odeakwụkwọ Ebonyi steeti bido na 2015 ruo 2018
  • Ọ zọrọ ọkwa gọvanọ Ebonyi steeti n'afọ 2019 na pati APC
  • Ọ bụ ọkammụta na ngalaba Geophysics

Nkwegu Edward Okereke - LP

Ebe foto si, Nkwegu Edward/Facebook

Ọ zọkwara ọkwa gọvanọ na 2015 nakwa 2019

Ọ bụ 'Architect'

Ọ bụ ojiego achụ ego a ma ama

Chukwuma Odii Ifeanyi - PDP

Ebe foto si, Chukwuma Odii Ifeanyi/Facebook

Ọ bụ onye Isu dị n'okpuru ọchịchị Ọnịcha, Ebonyi Steeti

Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum 'Open University' nke Naịjirịa.

Ọ dị afọ 48

Nwandugo Chukwuma Awuregu - AA

Ebe foto si, Nwandugo Chukwuma Awuregu

Ọ bụbu Kọmishọna ọrụ na njem n'Ebonyi Steeti

Ọ bụ civil engineer

Ọ dị afọ 54

Oziomaeze Kenneth Nwabueze - ADP

Ebe foto si, Oziomaeze Kenneth Nwabueze/Facebook

Ọ bụ onye ụkọchukwu maọbụ pastọ na bekee

Ọ dị afọ 47

Opoke Sunday Andrew - YPP

Ebe foto si, Opoke Sunday Andrew/Facebook

Ọ zọburu ọkwa gọvanọ na PDP tupu ọ banye YPP.

Ọ bụ ọkachamara na ngalaba mmụta gbasara ime ala nke bekee na-akpọ 'geology'

Ọ bụkwa onye oji ego achụ ego

Usulor Anthony N - NRM

Ebe foto si, Tony Usulor/Facebook

Tony Usulor mechara kwuo na ya agaghị azọzi ọkwa gọvanọ, na ọ ga-akwado Chukwuma Odii nke PDP.

Mana Inec ewepụghị aha ya n'akwụkwọ ndị na-azọ ọchịchị.

Adol-awam Chris Soni - NNPP

Ebe foto si, Adol-awam Chris/Facebook

Ndị ọzọ gụnyere...

Nwonomara Bernard Nyaba - ADC

Igwe Chinyere Judith - APM

Okpara Prince Apollos Ndubisi - APP

Nwankwo Michael Ikechukwu - SDP