Ihe ndị i kwesịrị ịma maka ụgbọala CNG
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
Gọọmenti Naịjrịa ekwuola na ha ga-ekesa akụrụngwa otu narị puku e ji agbanwe injini ụgbọala ndị na-eji mmanụ arụ ọrụ ka ha bụrụzie ndị na-eji CNG.
Dịka ha siri kwuo, nke a bụ iji belata gbalụgbalụ ndị mmadụ na-agabiga n'ihi oke ọnụahịa nke mmanụ ụgbọala na-ada ugbua.
Mana gịnị bụ CNG?

Compressed Natural Gas dịka e si akpọ ya n'asụsụ Bekee bụ gaasị a na-enweta site n'ikuku si na chi ma bụrụkwa nke yiri koolu.
A na-akpịkọta gaasị a n'ụzọ a pụrụ iji ya mepụta ọkụ latrik, kwọọ ụgbọala maọbụ mee ka ogige jụọ oyi site n'iji igwe ntụoyi bụ 'air conditioner'.
A rụrụ ụfọdụ ụgbọala ka ha jiri CNG na-arụ ọrụ, mana a pụkwara ịgbanwe ụgbọala ndị na-eji mmanụ arụ ọrụ ka ha malite iji CNG.
Onye ọbụla chọrọ ụdị mgbanwe a n'ụgbọala ya ga-eji akụrụngwa e ji agbanwe njini ụgbọala ndị na-eji mmanụ arụ ọrụ ka ha bụrụzie ndị na-eji CNG, nke gụnyere igbe cylinder.
I nwereike ịdị na-ajụ sị ọ bụkwanụ ego ole ka a pụrụ iji mee nke a?
Na mkparịtaụka ya na ụlọmgbasaozi Daily Trust nwere n'afọ 2023, Onyeisi otu Presidential Compressed Natural Gas Initiative bụ Senator Michael Oluwagbemi kwuru na ọ ga-efu ihe dịka narị puku Naịra atọ ruo narị puku Naịra isii iji mee ka ụgbọala malite iji CNG na-arụ ọrụ.
Ugbua lekwa ihe i ikwesịrị ịma ma ọ bụrụ na ị na-achọ ime ka ụgbọala gị malite iji CNG na-arụ ọrụ.
Zụta akụrụngwa nke ga-arụ ọrụ ọfụma n'ụgbọala gị.
Mata na nnukwu ohere agaghị adị n'azụ ụgbọala gị maka iji buo nnukwu ibu, n'ihi na ọ na-abụkarị ebe ahụ ka a na-adọnye igbe gaasị CNG.
Ọ bụ naanị ibu na-adịghị arụ ka ị ga na-ebu na-azụ ụgbọala gị.
I kwesịkwara ịchọpụta ma ọ ga-adịrị gị mfe ịdị na-enweta gaasị CNG oge ọbụla ị chọrọ ya.
Ka ọ dị, ọtụtụ ndị Naịjirịa na-ajụ ajụjụ ugbua ma ọ bụ naanị ndị nkịtị ka e meere iji CNG akwọ ụgbọala. Ụfọdụ na-ajụ sị "ọ bụ gịnị mere ndị ọchịchị achọghị ịgbanwe ụgbọala nke ha ka ha bụrụ nke na-eji CNG arụ arụ?"
Gwa anyị ihe i chere gbasara nke a.



