Ihe anyị ma gbasara ogbunigwe gbara na Borno steeti

Aha onyonyo, Ihe anyị ma gbasara ogbunigwe gbara na Borno steeti
Ihe anyị ma gbasara ogbunigwe gbara na Borno steeti
    • Onye dere ya, Marvelous Obomanu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
Ihe na-eme ugbua na Borno steeti

ogbunigwe daara na mpaghara dị iche iche na Borno steeti n'ụbọchị Mọnde abali iri na isii nke ọnwa Maachị afọ 2026 nke kpatara ụjọ ji banye ndị mmadụ na-ahụ.

Ogbunigwe gbara n'ahịa 'Monday Market, Ụlọọgwụ 'Borno Teaching Hospital, nakwa ụlọọrụ nzipu ozi 'post office' gburu ọtụtụ ndị mmadụ nke ana amabeghị ọnụọgụgụ.

N'ozi ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii steeti ahụ bụ Nahum Daso bipụtara kwuru na ọ bụ eziokwu na ọdachi ahụ mere mana ọ kọwaghị ihe kpatara mkpa mkpa ahụ ji me

Onyeisiala Tinubu katọrọ mwakpo ahu ma kwuo na ọ bụ ndị ọjọo na-eyi ọha egwu mere ya.

Ọ sị ndị na-eyi ndụ egwu na ndị ekperima chọrọ ị na-ekesasi ụjọ na ndụ ndị Naịjirịa maka ndị agha Naịjirịa na-arụgide ha mgbe ọbụla.

Aka na-achị Borno Steeti bụ Babagana Zulum kwuru na ọ bụ ihe ọjọ n'agbanyeghi n'ihe a nọ n'ime ya bụ ọge ibu ọnụ Ramadan.

O nyere iwu ka nchekwa dịkwuo elu n'ebe a na-efe ofufe dịka o tiri ndị ihe metụtara nakwa ezinụlọ ha aka na obi.