You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe onyonyo ndị na-egosi ego n'ime akpatị e si mba Gabon?
Dịka ewepụrụ onyeisiala Gabon bụ Ali Bongo Ondimba, ụfọdụ ihe onyonyo na-efegharị na-egosi ndị na-arụbu ọrụ gọọmentị ejidere ebe ha bu akpa ego.
BBC achọpụtala na opekatampe otu n'ime ihe onyonyo ndị ahụ abụghị eziokwu.
Ihe onyonyo ahụ gosiri ebe a nwụchiri onyeisi ụlọomeiwu mba Gabon bụ Guy Nzouba-Ndama n'afọ 2022.
N'ime ihe onyonyo ahụ Nzouba-Ndama nọ n'etiti ọha mmadụ n'azụ ụgbọala ukwu dịka agbakara akpatị abụọ ma chọpụta na ọ bụ ego CFA mba ahụ juru n'ime ya.
Nke a bụ ihe mere n'oke ala mba Gabon nakwa Kongo.
Mana ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia na-akọwa na ọ bụ n'ụbọchị 30 n'ọnwa Ọgọst ka o mere nke abụghị eziokwu.
O nwekwara ihe onyonyo ndị ọzọ nke ndi mmadụ na-ekesa na-ekwu na o si Gabon mana BBC achọpụtabeghi ma ndị ahụ a bụ eziokwu.
Abụọ n'ime ha na-egosi ebe ụfọdụ ụmụnwoke nọ n'imeụlọ ebe akpa dị icheiche nwere ego n'ime ya dịgasị.
O nwere ebe o ruru onye na-ese ihe onyonyo ahụ e gosi n'akụkụ aka nri onye yi uwe pụrụiche ndị nche mba Gabon bụ otu otu n'ime nke ndị agha napụrụ Ali Bongo ọchịchị n'ike.
Ụfodụ ndị mmadụ ekwuola na ọ bụ be nwa Ali Bongo ka esere ya bụ onyonyo ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ be otu onye ezinaụlọ ha ka ihe a mere.
Nwa Ali Bongo bụ Nouredin Bongo Valentin nakwa onyeisi ndị ọrụ ya bụ Chislain Ngoulou so na ndị ndị agha nwụchiri n'ime ụlọ ha.