Lee ihe ndị ị ga-ahụ tupu ị mara na osisi emeela ochie ma gbutuo ya

Aha onyonyo, Lee ihe ndị ị ga-ahụ tupu ị mara na osisi emeela ochie ma gbutuo ya
Lee ihe ndị ị ga-ahụ tupu ị mara na osisi emeela ochie ma gbutuo ya
Onye ntaakụkọ BBC Marvelous Obomanu
    • Onye dere ya, Marvelous Obomanu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist

N'oge na-adịbeghị anya, ka osisi dara n'obodo Ọhụm dị n'Enugwu Steeti ma kụgbo ọtụtụ mmadu.

Ụfọdụ kwuru na o nwere ndị nụrụ mgbe osisi ahụ na-egosi na ọ chọrọ ịda ma kpọọ oku ka e gbutuo ya, mana ndị na-efe osisi ahụ ekweghị ka nke ahụ mee.

Otu onye ụkọchụkwu n'obodo ahụ ihe a mere kọwara ihe ọ ma gbasara osisi ahụ.

Ọ bụ n'ihi nkea mere anyi ji jụọ ndị ọnụ na-erụ n'okwu etu mmadụ nwereike isi mata mgbe osisi chọrọ ịda iji gbochie ọghọm ga-esi na ya pụta.

Ọkammụta Adamu Aliyu Aliero, bụ Onyeisi otu na-ahụ maka ọmụmụ ihe gbasara osisi na Naịjirịa kọwara na oge osisi kwesịrị ịnọ tupu a mara na o meela ochie dabeere n'ụdị osisi ahụ n'ihi na e nwere ndị ndụ ha dị obere nweekwa ndị ndụ ha dị ogologo.

O kwuru na ụfọdụ osisi na-anọ ndụ ruo afọ iri na ise maobu karịa, ebe ndị ọzọ anaghị anọrụ oge dị etu ahụ.

Ọkammụta Aliero kwuru na ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ mara na osisi emeela ochie bụ na ahụ osisi ahụ ga-achagharị ka ihe dị ochie, ọkachasị ndị nje bacteria na-enye nsogbu. Ihe ọzọ bụ na akwụkwọ osisi ahụ ga-amalite ịchagharị na ma-ada. Osisi ahụ ga-amalite ịdị iche nke bụ na ọ gaghị adị etu o si adị na mbụ.

Ọ sị na ọ ga-adị mma ka e gbutuo ngalaba osisi ọbụla mere ochie nwa obere nwa obere kama igbutu ya kpam kpam. Ọ sị na ọ dịghị mma ịhapụ osisi ndị ngalaba ya toro oke ogologo maka na ndị nke mere ochie na-akachasị ada mgbe ọbụla a banyere n'oge udimmiri mgbe oke ifufe na-efe.

Aliero nyere ndị mmadụ ndụmọdụ ka ha ghara itinye ụgbọala ha n'okpuru osisi maobu nọrọ n'okpuru osisi na-ezu ike n'oge udummiri.