Ọrụ mmepe obodo abụghị naanị ọrụ gọọmenti etiti, gọọmenti steeti na nke okpuruọchịchị nwere ọrụ dịịrị ha – Onyeisiala Tinubu

Nchịkọta akụkọ ndị mere n'izu a

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Etu e si jide mmanụ anọ a na-enyoenyo maka iyi ọha egwu n’ọdọ ụgbọelu Akure, n’Ondọ steeti - FAAN

    Ụlọọrụ Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN)

    Ebe foto si, Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN) / Facebook.

    Ụlọọrụ Federal Airports Authority of Nigeria (FAAN) kwuola na e jidere mmadụ anọ bụ ndị a na-enyonyo maka iyi ọha egwu n’ọdọ ụgbọelu dị n’Akure, Ondo steeti.

    Onyeisi na ngalaba na-ahụ maka igbasaozi ọha bụ Henry Agbebire kwuru na nke a mere n’ụbọchị Sonde, abalị iri na ise nke ọnwa Maachị 2026.

    Agbebire kwuru na ọ bụ “ndị ọrụ nchekwa dị icheiche jidere ndị ahụ”.

    Ọ kọwara na ọtụtụ ndị omekome ahụ gbara ọsọ n’oge ndị ọrụ nchekwa bịara nso n’ebe ha si chọọ ịbata n’ọdọ ụgbọelu ahụ mana mmadụ anọ n’ime ha ka e jidere.

    Akụkọ ndị ọzọ gaamasị gị:

  2. Ndị uweojii Anambra Steeti ekeela nkwụcha maka idu Gọv. Soludo n’iyi ọrụ ugboro abụọ

    Ndị uweojii gbakọtara n'isiụlọọrụ ha dị n'Awka nke Anambra Steeti

    Ebe foto si, Anambra State Police

    Ndị uweojii Anambra Steeti sị ha ekeela nkwụcha maka emume idu Gọvanọ Chukwuma Soludo n’iyi ọrụ nke ugboro abụọ n’ụbọchị Tuzde 17 Maachị, 2026.

    Ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Tochukwu Ikenga wepụtara, kwuru na ha na-eme nke a site n’enyemaka ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ iji mee ka udo chịa n’oge ahụ.

    O kwuru na ha na-eme ka nchekwa zuo oke na mpaghara Anambra Steeti niile dịka ha na-akwado ịnabata ndị ọbịa n’oge ahụ

    Ikenga kwuru n’ime ụbọchị ole ma ole gara aga, na ha ka nabatara ndị uweojii mmadụ otu narị a zụrụ n’ụzọ pụrụiche n’ibu ngwaagha nakwa ịlụ ọgụ n’ụlọọrụ ọzụzụ ha dị n’Oji River.

    Ndị uweojii na-akpagharị n'ime ahịa dị n'Awka

    Ebe foto si, Anambra State Police

    O kwuru na a ga-eziga ndị a n’ebe dị iche iche na steeti ahụ iji hie asaa n’anya maka onye maọbụ ndị ọbụla nwereike ibute ọgbaghara n’oge ahụ.

    Ọ gara n’ihu dụọ ndị bi n’Anambra Steeti ndụmọdụ nakwa ndị na-abịa abịa ka onye ọbụla nọrọ jụụ ma rubeisi n’iwu n’oge emume idu n’iyi ọrụ ahụ.

    Cheta na Gọvanọ Soludo meriri na ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti nke e mere n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Nọvemba afọ 2025.

  3. Ihe anyị ma maka akụkọ kwuru na a gbara Broda Shaggi egbe

    Broda Shaggi yi uwe na-eji oji, kpuru okpu mmemme na ughegbe anya na ọla olu na-aza ekwentị

    Ebe foto si, Broda Shaggi

    Na mgbede ụbọchị Tọzde 12 Maachị, 2026 ka akụkọ malitere ifegharị na a gbara onye na-akpaọchị n’ịntanetị bụ Samuel Perry, e ji Broda Shaggi maara egbe, ebe ọ na-ese ihe onyonyo na Sango-Ota nke Ogun Steeti.

    Akụkọ kwuru na ihe ahụ mere n’ụbọchị Sọnde 8 Maachị, 2026 n’okpuru akwammiri Sango-Ota dị n’Ogun, kama na o dochabeghi anya etu o si mee.

    Akụkọ kwukwara na otu onye uweojii na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na a gbara nwamadị a egbe dịka ọ na-ese ihe onyonyo na Sango-Ota.

    Akụkọ ahụ kwuru na e buuru Broda Shaggi gawa n’ụlọọgwụ bụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ ugbua.

    Ndị uweojii Ogun State kwuru na ha na-eme nnyocha banyere akụkọ kwuru na a gbara Broda Shaggi egbe.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Steeti ahụ Oluseyi Babaseyi kwuru na ha enweghi ike ikwu maọbụ n’Ogun Steeti ka a gbara ya egbe ahụ kama na nnyocha na-aga n’ihu.

    N’otu aka ahụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Legọs Steeti bụ Abimbola Adebisi, kwuru na ụlọọgwụ ebe Broda Shaggi na-anata ọgwụgwọ kpọrọ ha iji mee mkpesa ahụ.

    O kwuru na ndị uweojii gara n’ụlọọgwụ ahụ mgbe ha natara ozi na ha na-agwọ onye a gbara egbe, na ngwa ngwa ha ruru ka ha chọpụtara na ọ bụ Broda Shaggi.

  4. Henry Nwosu gbabuuru Super Eagles bọọlụ anwụọla ka ọ gbachara afọ 62

    Nwosu, mgbe o yi uwe egwuregwu ndị Super Eagles na mgbe oyi uweocha n'elu ma nọrọ n'ụlọọgwụ

    Ebe foto si, Olusegun Patrick Odegbami

    Onye gbabuuru Super Eagles nke Naịjirịa bọọlụ bụ Henry Nwosu anwụọla n’isi ụtụtụ Satọde dịka ọ gbachara afọ iri isii na abụọ.

    Ọ bụ Segun Odegbami gbabuuru Super Eagles bọọlụ kwupụtara ọnwụ ya n’akara soshal midia ya.

    Odegbami kwuru na Nwosu nwụrụ n’ihe dịka elekere anọ nke isi ụtụtụ n’ụlọọgwụ nkuzi Mahadum Legọs Steeti dị n’Idi-Araba bụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ kamgbe ụbọchị Wenezde 11 Maachị 2026.

    “Ọ bụ nnukwu ihe mwute n’obi m na ọ bụ ga-ekwupụta ọnwụ ka m ji ekwupụta ọnwụ Henry Nwosu. Ka mkpụrụobi ya laa na ndokwa n’eluigwe.”

    Nwosu bụ nwafọ Imo Steeti gbara bọọlụ n’ebe etiti ma marakwa nke ekwe na-akụ n’egwuregwu bọọlụ. O so n’otu egwuregwu ndị Naịjirịa mabutere Iko mba Afrịka n’afọ 1980 bụ nke mbụ ha n’obodo Naịjirịa.

    O mere ọfụma n’asọmpi ahụ ma bụrụkwa onye a ma ama n’okwu banyere egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa.

    Dịka ọ wụsachara ọwa n’ịgba bọọlụ, Nwosu gara n’ihu banye n’ọrụ ikuziri ndị na-etolite etolite ihe banyere egwuregwu bọọlụ, ọkachasị n’ime ime obodo.

    Akụkọ ndị ọzọ gaamasị gị:

  5. A tụọla ogbunigwe n’ụlọnnọchiteanya mba Amerịka dị na Baghdad

    Foto e si n'elu see nke gosiri ebe ahụ mwakpo ahụ mere

    Ebe foto si, Reuters

    Akụkọ kwuru na a tụrụ ogbunigwe n’ogige ụlọnnọchiteanya mba Amerịka dị na Baghdad n’Ịrak dịka ihe onyonyo na-efeagharị ns soshal midia gosiri nnukwu anwụrụ ọkụ si ebe ahụ apụta.

    Nke a na-abịa dịka Onyeisiala Donald Trump kwuru na ndịagha Amerịka awakpola ma bibie ogige mmanụ agbidi mba Ịran niile.

    Kharg Island dị na mpaghara ugwu Gulf, bụ ogige mmanụ agbidi dị ntakịrị ma dịkwa oke mkpa. Ọ dị nso n’akụkụ Ịran.

    Na nzaghachi, Tehran kwuru na ha ga-awakpo ogige mmanụ agbidi mba ọbụla na-akwado mba Amerịka ma ọ bụrụ na a gaa n’ihu na-awakpo ogige mmanụ gbidi mba Ịran.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  6. Ọrụ mmepe obodo abụghị naanị ọrụ gọọmenti etiti, gọọmenti steeti na nke okpuruọchịchị nwere ọrụ dịịrị ha – Onyeisiala Tinubu

    Oge Onyeisiala Tinubu na-agwa ndịisi ụlọọrụ mgbasaozi okwu n'ọgbakọ ahụ ha nwere

    Ebe foto si, Sunday Moses/Instagram

    Onyeisiala Bola Tinubu emeela ka o doo anya na ọrụ mmepe obodo bụ ọrụ dịịrị gọọmenti etiti, gọọmenti steeti nakwa gọọmenti okpuruọchịchị ma gwa ndị ntaakụkọ ka ha na-elebanyere gọọmenti steeti na nke okpuruọchịchị anya iji hụ na ha na-arụ ọrụ ha kwesịrị ịrụ.

    Onyeisiala Tinubu kwuru nke a n’Abuja oge ya na ndịisi ụlọọrụ mgbasaozi dị iche iche nwere mkparịtaụka n’obi ọchịchị Aso Rock, Abuja.

    O kwuru na ọchịchị gọọmenti ya enyela gọọmenti steeti na nke okpuruọchịchị nwereonwe nke ha iji ego ha rụọrọ ndị obodo ọrụ.

    “Ọbụghị naanị m ka ụnụ ga na-agba ajụjụ ma na-enyocha banyere ọrụ mmepe obodo, ụnụ gbaa gọọmenti steeti na nke ọkpuruọchịchị ajụjụ ma na-enyochakwa ọrụ ha nakwa ihe ha ji ego gọọmenti etiti na-enye ha eme,” ka Onyeisiala Tinubu kwuru.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  7. Ụtụtụ ọma ndị be nayị

    Ụmụigbo, anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 14 Maachị, 2026.

    Ọfọ anyị taa bụ ka ihe ọma meere gị na ezinaụlọ gị na ndị enyi gị niile.

    Anyị abịala iwetere gị akụkọ si Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile taa.

    Biko sọnyere anyị na Facebook, Instagram nakwa WhatsApp chanelụ maka akụkọ foto na vidio ndị ọzọ anyị ji bịa.

    Daalụ!

  8. Njem e ji agbara APC ụgbọ nwamkpi amalitela – Kenneth Okonkwo

    Njem e ji agbara APC ụgbọ nwamkpi amalitela – Kenneth Okonkwo

    Ebe foto si, Kenneth Okonkwo/Instagram

    Dịka a na-akwado maka ntuliaka afọ 2027, otu onye a ma ama na pati African Democratic Congress (ADC) bụ Kenneth Okonkwo ekwuola na obi siri ya ike na otu ahụ ga-akwụsị ọchịchị pati All Progressives Congress.

    Oge ọ na-ekwu okwu n’ihe omume ụlọmgbasaozi Channels TV, Okonkwo sịrị na ha amalitela njem ịchụpụ pati nọ n’ọkwa.

    N’oge ihe omume ahụ, Kenneth Okonkwo katọrọ ntuliaka ọchịchị ime obodo a haziri n’ụbọchị 21 Febụwarị n’Abuja ma kọwaa ya dịka nke jupụtara n’aghụghọ.

    O bokwara Minista Nyesom Wike ebubo igbochi ndị na-agba gọọmenti ụkwụ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  9. Ndị ọrụ mmadụ isii anwụọla mgbe ụgbọelu Amerịka na-etinye mmanụ ọkụ kpọkara n’Ịrakị

    Foto faịlụ nke ụgbọelu Boeing KC-135 Stratotanker nke ndịagha ikuku mba Amerịka, nke a hụrụ n'Izrel na Febụwarị

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Foto faịlụ nke ụgbọelu Boeing KC-135 Stratotanker nke ndịagha ikuku mba Amerịka, nke a hụrụ n'Izrel na Febụwarị

    A chọpụtala na mmadụ isii ndịagha Amerịka na-etinye mmanụ n'ụgbọelu nwụrụ mgbe ụgbọelu ahụ kpọkara n'ọdịda anyanwụ Ịrakị, dịka ụlọọrụ Central Command (Centcom) nke mba Amerịka si kwuo.

    E kwuru na mbụ na ọrụ nnapụta gara n'ihu mgbe C-135 furu efu, ebe o kwukwara na ọ dịghị ọkụ ọjọọ ma ọ bụ nke enyi metụtara ọdịda ụgbọelu ahụ.

    E kwuru na ụgbọelu tankị ahụ so na ndị Amerịka ji na-awakpo mba Ịran, ọ bụkwa otu n'ime ụgbọelu abụọ ihe merenụ metụtara. Nke abụọ rutere n'udo.

    Ụgbọelu ndị Boeing mepụtara nwereike ịgbara ụgbọelu mmanụ n'elu ikuku ma na-arụkarị ọrụ dị mkpa n'ọrụ agha mba Amerịka. E jiri ha mee ihe nke ukwuu n'agha Gulf mbụ iji gbasaa ọtụtụ ụgbọelu agha na bọmbụ.

    Lee akụkọ ọzọ ga-amasị gị:

  10. Amerịka akwụsịtụla mmachị ha machiri mmanụ si mba Rọshịa

    Ụgbọmmiri bu mmanụ nọ n'osimiri

    Ebe foto si, Reuters

    Mba Amerịka ekwuola na ha ga-akwụsịtụ mmachi ha machiri mba ndị ọzọ ịzụta mmanụ agbidi n’aka mba Rọshịa, nke a bụ iji belata oke ọnụahịa mmanụ na mbaụwa.

    Obi ọchịchị Kremlin mba Rọshịa kwuru na ha nabatara nkwụsịtụ ahụ ma kwuo na ọ bụ ezi ihe.

    Ọnụahịa otu ite barrel mmanụ agbidi ruru otu narị dọla n’izuụka a dịka a wakporo ụgbọmmiri bu mmanụ agbidi atọ na mpaghara Gulf.

    Vidio si Tehran BBC Verify nyochara, gosiri oge a wakporo ụgbọmmiri ndị ahụ.

    Onyeisiala Trump kwuru na Amerịka na-aganihu ebibi ọchịchị mba Ịran ma kwuo ka e chere aka ghọrọ ihe ga-eme n’ụbọchị Fraịde.

    N’aka nke ọzọ, akụkọ kwuru na a na-agbatu droonu ọbụla na-abata n’ogige igwe mba Sawụdi Arebia dịka ndị ọchịchị na Dubai kwuru na ha hụrụ mkpọkọrọ ogbunigwe dara n’otu ụlọ.

    Ndịagha Amerịka kwuru na mmadụ anọ nọ n’ụgbọelu ahụ a na-agbanye mmanụ n’ikuku a gbaturu, anwụọla.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  11. Onyeisiala Tinubu akwadola ka a zụtara ndịagha ngwaagha ọhụrụ iji nye aka n'agha iyi ndụ egwu

    Foto Onyeisiala Tinubu oge ọ na-ebinye aka n'akwụkwọ

    Ebe foto si, Bola Tinubu/Faceook

    Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu enyela nkwado ka a zụtara ndịagha Naịjirịa akụrụngwa agha ọhụrụ iji kwado agha ha na-ebu megide ndị na-eyi ọha egwu n’ebe dị iche iche na Naịjirịa.

    Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa bụ Ọchịagha Christopher Musa gbara nke a n’anwụ oge ọ gwara ndị ntaakụkọ okwu dịka ya na Onyeisiala Tinubu nwere mkparịtaụka n’obi ọchịchị dị n’Abuja ma kwuo na Onyeisiala Tinubu kwụrụ chịm inye ndịagha nkwado zuruoke n’agha ha na-ebu megide ndị na-eyi ọha egwu na Naịjirịa.

    Musa kwuru na Onyeisiala Tinubu kwere nkwa inye ndịagha akụrụngwa ndị a iji hụ na ha chekwara Naịjirịa mana Musa ekwughị akụrụngwa ọhụrụ ndị ahụ a ga-azụrụ ndịagha.

    Ndị ọzọ sonyere na mkparịtaụka ahụ nke a chịkọbara iji gwa Onyeisiala Tinubu mbọ ụfọdụ ndịagha na-agba imegide ndị na-eyi ọha egwu, gụnyere onyeisi ndị uweojii bụ Tunji Disu.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  12. Igbo ndị ọma, ụnụ asaala chi?

    Ụmụigbo, anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Fraịde 13 Maachị, 2026.

    Ọfọ anyị taa bụ ka ihe ọma meere gị na ezinaụlọ gị na ndị enyi gị niile.

    Anyị abịala iwetere gị akụkọ si Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile taa.

    Biko sọnyere anyị na Facebook, Instagram nakwa WhatsApp chanelụ maka akụkọ foto na vidio ndị ọzọ anyị ji bịa.

    Daalụ!

  13. Ụlọọgwụ nkụzi UNIZIK akwụsịtụla imejupụta ụgwọ akwụkwọ N580,000 maka ụmụakwụkwọ nọọsụ

    Ụlọọgwụ nkụzi UNIZIK akwụsịtụla imejupụta ụgwọ akwụkwọ N580,000 maka ụmụakwụkwọ nọọsụ

    Ebe foto si, NNAMDI AZIKIWE UNIVERSITY TEACHING HOSPITAL, NNEWI

    Ụlọọgwụ nkụzi nke mahadum Nnamdi Azikiwe University dị n’Awka akwụsịtụla imejupụta ụgwọ akwụkwọ narị puku naịra ise na iri asatọ (N580,000) maka ụmụakwụkwọ nọọsụ.

    Nnukwu Onyeisi ụlọọgwụ UNIZIK bụ Ọkankụzi Joseph Ugboaja kwupụtara nke a oge ya na ndị ntaakụkọ ụlọmgbasaozi Channels TV na-akparịta ụka n’otu ihe omume a haziri na tivii n’ụbọchị Tọzde 12 Maachị 2026.

    Mbuli e buliri ụgwọ akwụkwọ n’ụlọọgwụ UNIZIK butere iwe na ọnụma na nso nso a, nke mere ka ụmụakwụkwọ nọọsụ mee ngagharịiwe, n’ihi pasenti narị ise a gbakwunyere n’ụgwọ akwụkwọ ha.

    Na nso nso a ka e sitere na puku naịra iri itoolu bugoo ụgwọ akwụkwọ ndị nọọsụ n’ọnụego narị puku naịra ise na iri asatọ.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

    Dịka Ugboaja siri kwuo, mkpebi ịkwụsịtụ ụgwọ akwụkwọ ọhụrụ ahụ sochiri nzukọ dịịrị n’etiti ndị ndu ụmụakwụkwọ, ndị isi ụlọakwụkwọ nakwa bọọdụ na-achịkọta mahadum ahụ, oge ụmụakwụkwọ mechara ngagharịiwe.

    Onyeisi ụlọọgwụ UNIZIK kwara arịrị ma kwuo na ụlọọgwụ nkụzi anaghị eketa oke n’ego enyemaka si n’akpaego Tertiary Education Trust Fund (TETFund), ma kwuo na ọ bụ nke ahụ kpatara e jiri bulie ụgwọ akwụkwọ.

    Ọ gbakwunyere na ihe ọzọ mere e ji bulie ụgwọ akwụkwọ bụ maka atụmatụ UNIZIK nwere ịrụ ụlọọgwụ nkụzi ga-esonye n’ime atọ ndị bụ ọkaibe na Naịjirịa n’afọ 2030.

  14. Tambuwal ahapụla pati PDP, banye na ADC

    Tambuwal kwuru na esemokwu ndị na-aga n'ihu n'ime PDP emeela ka ịdị n'otu na ntụziaka nke otu ahụ ghara ịdị ire.

    Ebe foto si, Aminu Waziri Tambuwal/ Facebook

    Nkọwa foto, Tambuwal kwuru na esemokwu ndị na-aga n'ihu n'ime PDP emeela ka ịdị n'otu na ntụziaka nke otu ahụ ghara ịdị ire.

    Onye bụbu Gọvanọ na Sokoto Steeti bụ Sịnetọ Aminu Tambuwal agbaala arụkwaghịm na pati Peoples Democratic Party (PDP) ma banye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị African Democratic Congress (ADC).

    N'akwụkwọ ozi nke o degaara onyeisi ngalaba ya na Tambuwal/Shinfiri Ward nke mpaghara gọọmentị Tambuwal n’ụbọchị Maachị 11, 2026 ka Tambuwal kwupụtara mkpebi ya ịpụ na pati PDP ozugbo.

    Tambuwal bụ onye bụbu onyeisioche nke ụlọnnọchiteanya kọwara na mkpebi ya sochiri ntụgharị uche miri emi na mkparịtaụka sara mbara ya na ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị na-akwado ya mere.

    Dịka o si kwuo, nsogbu dị n'ime otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị PDP ka na-aga n'ihu, esemokwu ndị isi, na nkewa na-eto eto n'ime otu ahụ emeela ka o siere ya ike ịnọgide na-abụ onye otu ya.

    Tambuwal, onye jere ozi dịka onye omeiwu na-anọchite anya mpaghara Sokoto Saụt, kwuru na esemokwu ndị na-aga n'ihu n'ime PDP emeela ka ịdị n'otu na ntụziaka nke e jiri mara otu ahụ daa mba.

    Lee akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị ebe a:

  15. A wakpola ụgbọmmiri atọ na mpaghara Gulf dịka ọnụahịa otu ite mmanụ agbidi na-eru narị dọla

    Foto ụgbọmmiri mmanụ agbidi ahụ a wakporo

    Ebe foto si, Reuters

    Ọnụahịa otu ite ‘barrel’ mmanụ agbidi eruola narị dọla dịka a wakporo ụgbọmmiri ibu atọ na mpaghara Gulf.

    Ọrịrị ọnụahịa a na-abịa n’agbanyeghị na mba iri atọ na abụọ nọrọ n’ụbọchị Wenezde 11 Maachị, 2026 nwee nkwekọrịta iwepụta ite mmanụ ruru nde narị anọ (400m) iji butuo ọnụahịa mmanụ a.

    E kwuru na ogbunigwe a na-amaghị ndị tụrụ ya wakporo ụgbọmmiri abụọ n’akụkụ mba Ịrak ebe ogbunigwe ọzọ a na-amaghịkwa ndị tụrụ ya wakporo gbọmmiri ibu kọntena n’akụkụ UAE.

    Nke a na-abịa dịka Onyeisiala Donald Trump nọrọ n’ụbọchị Wenezde 11 Maachị, 2026 kwuo na ọnụahịa mmanụ ga-ada ruo etu a na-atụghị anya.

    Mwakpo ọhụrụ Izrel wakporo Ịran, egbuola ọtụtụ mmadụ na Lebanọn ma gbuo asatọ na Beirut dịka Izrel na-agakwa n’ihu na mwakpo ha na-me n’Ịran.

    Foto ụgbọmmiri mmanụ agbidi ahụ a wakporo

    Ebe foto si, Reuters

  16. Ọnụahịa mmanụ ụgbọala ga-ada – Trump

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Donald Trump

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọnụahịa mmanụ ụgbọala ga-ada karịa etu ọ dị ugbua.

    Trump kwuru nke a dịka mba ruru iri atọ na abụọ kwekọtara iwepụta mmanụ ụgbọala ha chekwara ma tinye n’ọba mmanụ ha nke ga-enyereaka mee ka mmanụ ụgbọala dị ma dị ọnụ ala n’ebe niile.

    Trump kọwara etu ọnụahịa mmanụ ụgbọala si arịelu ma na-adaala dịka ihe a na-ahụ n’oge agha.

    “A ga m ekwu na ọ rịrị elu nwa obele karịa ka anyị si chere. Mana ọ ga-agbadaala karịa etu onye ọbụla ga-esi aghọta”.

  17. Ụlọọrụ LPDC akagbuola ebubo asambodo adịgboroja e boro Benjamin Kalu osote onyeisi ụlọomeiwu nta Naịjirịa

    Ụlọọrụ LPDC akagbuola ebubo asambodo adịgboroja e boro Benjamin Kalu osote onyeisi ụlọomeiwu nta Naịjirịa

    Ebe foto si, Benjami Kalu/Facebook

    Otu kọmiiti Legal Practitioners Disciplinary Committee (LPDC) akagbuola ebubo asambodo adịgboroja e boro Benjamin Kalu bụ ososte onyeisi ụlọomeiwu nta Naịjirịa ma kwuo na enweghị eziokwu ọbụla dị n’ebubo ahụ.

    LPDC gara n’ihu kwuo na ebubo asambodo NYSC na ụlọakwụkwọ ndị ọkaiwu ‘law school’ e boro Kalu adabanyeghị n’ịlọọrụ ha ma kwuo na ebubo ndị ahụ enweghị isi ọbụla.

    Cheta na John Martins boro ebubo na Kalu dara iwu NYSC maka na ọ gara ụlọakwụkwọ ndị ọkaiwu Naịjirịa otu oge ọ na-eme emume NYSC.

    Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

  18. Ụtụtụ ọma ndị be anyị

    Igbo ndị ọma, anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Tọzde 12 Maachị, 2026.

    Anyị abịala iwetere gị akụkọ si Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa niile taa.

    Biko sọnyere anyị na Facebook, Instagram nakwa WhatsApp chanelụ maka akụkọ foto na vidio ndị ọzọ anyị ji bịa

    Nnọọ!

  19. Onyeisiala Donald Trump ekwuola na Amerịka “emechabeghị” mgbe ajụrụ ya gbasara ọgụ na-eme na mba Iran

    Trump sị na Amerịka awakpola Iran otu kachasị njọ kara mba ọbụla ma kwuo na Amerịka emechabeghị

    Ebe foto si, EPA/Shutterstock

    Nkọwa foto, Trump sị na Amerịka awakpola Iran otu kachasị njọ kara mba ọbụla ma kwuo na Amerịka emechabeghị

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na Amerịka “adịbeghị mecha” mwakpo ha na-eme na Mba Iran.

    Trump onye kwuru nkea mgbe ndị ntaakụkọ na-ajụ ya ajujụ gbasara ọgụ a na-alụ na Iran sị na “ndịagha ụgbọelu mba Iran anọghịzikwa ya”, "Ndị nchekwa ha anọghịjikwa ya", “ndị ndụ ha anọghịzikwa ya”, dịka ọ sị na “Amerịka nwereike ime nke ka njọ”

    Nkea na-abịa dịka mba iri atọ na abụọ sonyere na otu ‘International Energy Agency’ kwenyere na ha ga-ewepụta ebe nchekwa mmanụ ha iji beleta nsogbu ụkọ mmanụ na-ahịa.

    Otu a nke mba Yurope na Amerịka so na ya si na ha ga-ewepụta mmanụ ruru nde narị anọ.

    Gụọ akụkọ ọzọ ebe a:

  20. Gọvanọ Peter Mbah: ‘Ndigbo kwesịrị ịkwụsị ịkpapụ onwe ha na ndọrọndọrọ ọchịchị n’Etiti’

    Aka na-achị Enugu steeti bụ Peter Mbah

    Ebe foto si, Enugu Government

    Nkọwa foto, Aka na-achị Enugu steeti bụ Peter Mbah

    Aka na-achị Enugwu steeti bụ Peter Mbah enyela ndị Igbo ndụmọdụ ka ha ghara ịdị na akpachapụ onwe ha na ndọrọndọrọ ọchịchị n’Etiti, kama ka ha jikọọ aka ọnụ soro agbụrụ ndị ọzọ na Naijiria were na-eketa oke ha oge niile.

    Mba, onye kwuru nke a oge ndị nchịkọta otu “City Boy Movement” biara leta ya n’obi gọọmenti Enugwu, kwuru n’ikpeazụ a, ndị Igbo na-agụpụ onwe ha n’ọchịchị nke etiti nke abụghị ihe e jiri mara ha.

    Mba sịrị,“Ọ bụrụ na I lee anya n’ihe mere ochie na ndị bu anyị ụzọ, ha na ndị nọ n’ofe Naija na-ekwekọrịta n’aka mgbe ọbụla ọ dị mkpa.”

    “Anyị bụ Ndigbo anaghị eji ile anya n’ihu adọ ndọrọndọrọ ọchịchị , anyị na-egwu ndọrọndọrọ ọchịchị iji keta ihe ruru anyị dịka ndị bu anyị ụzọ siri mee. Anyị agaghị ekwe ka nke a funarị anyị.”

    Na mbido, onye nchịkọta otu City Boys Movement n’Ọwụwa Anyanwụ bụ Obinna Iyiegbu, a ma dịka ‘Obi Cubana’ gwara gọvanọ na Ndigbo bụbu ụkwụ nke atọ ji ite ọna n’okwu ndọrọndọrọ ọchịchị mana ugbua n’ihi ngụpụ Igbo gụpụrụ onwe ha, na ndị ọzọ na-enweta mmeri na ndọrọndọrọ ọchịchị na-agụnyeghị vootu ndị Ọwụwa Anyanwụ.”

    Gụọ akụkọ ndị ọzọ ebea: