Etu ọtụtụ ngwaahịa si laa n'iyi n'ọkụ gbara na Main Market Onitsha

Aha onyonyo, Onitsha Main Market Fire: Etu ọtụtụ ngwaahịa si laa n'iyi n'ọkụ gbara n'Otu Nkwọ Ọnịcha

Akụkọ si Ọnịcha apụta ugbua na-ekwu na ọkụ na-agba n'ahịa Otu Nkwọ Ọnịcha nke e ji 'Main Market' mara.

Mpaghara ebe na-agba ọkụ a dịka akụkọ anyị hụrụ na Twitter si kwuo bụ ebe a na-akpọ 'Front line' nke dị nso n'ụlọ a na-akpọ 'White House'.

Ya bụ ọkụ malitere n'isi ụtụtụ taa bụ Tuzde, ụbọchị 21 nke ọnwa Maachị 2023.

'White House' bụ ụlọ ebe onyeisi ahịa 'Main market' nwere ụlọọrụ ya, ọ bụkwa n'ụlọ ahụ ka ndị nche ahịa ahụ nwere isi ụlọọrụ ha.

BBC Igbo kpọrọ onyeisi ụlọọrụ mgbanyụ ọkụ Anambra Steeti bụ Martin Agbili n'ekwentị mana ọ zaghị. Ọ sabeghịkwa ajụjụ anyị zigaara ya n'akara ekwentị ya.

Otu onye na-azụ ahịa na Main market kwuru na ya bụ ọkụ na-agba n'eziokwu.

O dobeghị anya ihe kpatara ọkụ a, mana BBC ezigala onye ntaakụkọ iji chọpụta ihe mere ebe ahụ kpọmkwem.

Dịka onye ahụ gwara BBC Igbo okwu si kwuo, ihe a na-ere na mpaghara ebe ahụ gbara ọkụ bụ akwa 'lace' na 'akwa george'.

"Ndị na-ere ihe e ji akwa akwa, a na-akpọ 'tailoring materials' na-anọkwa ebe ahụ, tinyekwara ụfọdụ na-ere ụdị akwa ndị ọzọ dịka 'jeans, polo' na ndị dịka ha. Ọtụtụ ngwaahịa ndị mmadụ lara n'iyi n'ọkụ ahụ," ka nwa amadị ahụ kwuru.

Ebe foto si, Screengrab

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Kedụ maka ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ?

Nkọwa foto, Ndị mmadụ kwuru na ọ bụ naanị otu ụgbọala mgbanyụ ọkụ gbatara ọsọ enyemaka

Otu onye gwara BBC okwu kwuru na ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ abịaghị n'oge ịgbanyụ ọkụ ahụ.

O kwukwara na oge ha bịara, ọ bụ naanị otu ụgbọala mgbanyụ ọkụ ka ha bu bịa nke mere ndị mmadụ ji atamu ntamu.

Onye ahụ kwukwara na ọ bụ naanị otu ụlọ dị nso na White House ka ọkụ ahụ metụtara.

Na soshal midịa, ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ n'Asaba ka ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ si bịa, mana BBC achọpụtabeghị ma nke a ọ bụ eziokwu.

Onye a gwara BBC okwu kwuru na otu ụgbọala mgbanyụ ọkụ nke Anambra Steeti mechara bịa tinye aka iji gbanyụọ ya bụ ọkụ.

"Agbanyụọla ọkụ ahụ ugbua," nwa amadị a gwara anyị n'ebe elekere itoolu n'ọkwra nke ụtụtụ Tuzde.