Ihe jikọrọ mụ na City Boys Movement - Enviable
Na mkparịtaụka a, Ituma Chukwuemeka Enviable hiwere ụlọọrụ Enviable Group kọwara etu njem ya dịka onye ji ego achụ ego si malite dịka nwataakwụkwọ na mahadum Michael Okpara University of Agriculture, Umudike, Abia Steeti ebe m gụrụ Business and Management.
Ọ kọwara ọtụtụ ihe banyere onwe ya. O kwuru na a mụrụ ya n'obodo Ibenta dị n'okpuru ọchịchị Ohaukwu dị n'Ebonyi steeti.
"Agara m ụlọakwụkwọ praịmarị na sekọndrị ya n'Ebonyi steeti tupu m gaa Abia steeti gụọ mahadum Michael Okpara University of Agriculture, Umudike, Abia Steeti ebe m gụrụ Business and Management" ka o kwuru.
N'okwu ya, "Nne na nna m enweghị ego, emere m ọtụtụ ihe iji zụọ onwe m na mahadum". O gara n'ihu kọwaa etu o si malite ịgba ọgbatumtum dịka nwataakwụkwọ.
Etu si malite azụmahịa ire egwusi
N'ihi na nne na nna ya enweghị ego, Chukwuemeka kwuru na o mere ọtụtụ ihe iji nweta ego.
"Ihe mbụ m mere iji nweta ego na mahadum bụ ire egwusi iji kwado onwe m". Amalitere m ịga zụta egwusi n'Aba, kwọọ ya ma kechie ya na-eresi ya ndị mmadụ n'ụlọakwụkwọ anyị oge ahụ".
Ọ kọwara na oge adịghị anya, ndị ụlọọrụ Nafdac bịara machie ya ire egwusi ahụ.
"Nafdac kwuru na m enweghị akara ikike ha na-enye ndị na-emepụta ihe oriri na Naịjirịa. Nke a mere ka m kwụsị ire egwusi ahụ ma malite ịchọ ihe ọzọ m ga-eme iji na-enweta ego".
Ọgbatumtum mbụ m zụtara
Oge a kwụsrịrị ya ire egwusi, Enviable kwuru na ọ malitere ịchọ ihe ọ ga-eme iji nweta ego. Ọ bụ oge ahụ ka echiche ịbụ onye na-akwọ ọgbatumtum.
Ọ zụtara ọgbatumtum mbụ ya ma kwuo na ọ kwụzụghị ụgwọ ya ohe ọ zụtara maka na ego ya niile gwụrụ oge ndị ọrụ Nafdac machiri ya ire egwusi.
Enviable kwuru na ọ malitere ịgba ọgbatumtum n'ime ụlọakwụkwọ mana oge adịghị anya, onyeisi ụlọaakwụkwọ ha oge ahụ bịara machie ọgbatumtum ịgba n'ime ụlọakwụwkọ ahụ ma kwuo na ọ bụ naanị Keke ka ọ chọrọ ka ọ na-agba na mahadum ahụ.
Nke a mere ka o ree ọgbatumtum ya ma malite ịchọ etu ọ ga-esi zụta Keke.
Ọ gara n'ihu kọwaa etu o si zụta Keke mbụ ya nakwa ihe ụfọdụ ọ gabigara.
O kwuru na Keke mbụ ọ zụtara kpụrụ isi a kpụrụ Albert ma kwuo na ọtụtụ ndị ọzọ na-agba Keke na mahadum ahụ malitere ịgwa ya ka ọ ga-azụta Keke dị mma site n'usoro 'hire purchase'.
Ọ bụ etu ahụ ka o si ga-azụta Keke mbụ ya ma zụta ndị ọzọ n'oge adịghị anya.
Oge mbụ m hụrụ Obi Cubana
Banyere etu ya na Obi Cubana si zute onwe ha, Enviable kwuru na ọ bụ n'otu mmemme enyi Obi Cubana mere ka ha abụọ zutere onwe ha.
Ọ kọwara na ọ gwara Obi Cubana na ọ chọrọ ka ha abụọ malite ịzụkọ ahịa iji nyere ya aka kwalite azụmahịa.
"Obi Cubana kwuru na tupu mụ na ya amalite ịzụkọ ahịa, ọ ga-eme nnyocha iji chọpụta na m anaghị eme chandum".
Ọ bụ ka o mechara nnyocha ahụ ka Obi Cubana na Enviable malitere ịzụkọ ahịa.
Ka ọ dị ugbua, Enviable kwuru na Obi Cubana bụ onyeisioche ụlọọrụ Enviable Group.
Banyere onye nwee ụlọọrụ Enviable Group, Enviable kwuru na "Ọ bụghị naanị otu onye nwee ụlọọrụ Enviable Group, Obi Cubana bụ onyeisioche Enviable Group mana e nwerekwara ọtụtụ ndị Igbo ọzọ so nwere ụlọọrụ Enviable Group.



