Kenya election 2022 results: Etu mpụtara ntuliaka ọkwa Onyeisiala mba Kenya si aga

Ụmụafọ mba Kenya ebinyela aka iji họpụta onyeisiala ọhụrụ, ụlọomeiw, ndị Sịnetọ nakwa ndị Gọvanọ nke mba ha.

Ndị pụtara binya aka ebughi ibụ dịka naanị vootu a tụrụ bụ nde 12.1 n'ime vootu nde 21 a tụrụ anya e kwesịrị ịtụ.

Ụfọdụ n'ime ha hichara ụra n'ọdọ ebe a na-atụ vootu iji hụ na ha binyere aka.

Otu ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ bụ kedụ a ga-akpọpụta onye meriri?

Ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent Electoral and Boundary Commission (IEBC) bụ ndị nwere ikike ịkpọpụta onye meriri n'ọkwa Onyeisiala.

Nke a ga-abụ ma ha kpokọta, hazie, gụọ vootu si n'odo ebe niile a tụrụ vootu (polling unit).

Iwu ha kwuru na onyeisiala ụlọọrụ ga-akpọpụta onye meriri ma degara onyeisi ọkaikpe nakwa onyeisiala bụ Uhuru Kenyatta akwụkwọ.

Etu a ga-esi akpọpụta onye meriri?

Iji merie na ntuliaka ọkwa Onyeisiala agba nke mbụ, onye na-azọ ọkwa ga-enwete:

Vootu karịrị ọkara vootu niile a tụrụ na mba ha.

Opekatampe vootu pasentị 25% a tụrụ na mpaghara (counties) 24 dị na mba ahụ.

A ga-atụkwa vootu ịhọpụta ndị ụlọomeiwu, ndị sịnetọ, ndị gọvanọ, ndị omeiwu steeti nakwa ụmụnwaanyị 47 ga-ewere ọkwa n'ụlọomeiwu.

A ga-amalite ịgụkọ vootu ndị a ngwa ngwa a tụchara ma pịachie oge ibinye aka.

E mechiela ọdọ ebe ndị a na-atụ vootu na Kenya.

Mmadụ anọ na-azọ ọkwa ịbụ onyeisiala, dịka ndị na-atụ vootu ga-ahọpụtakwa ndị gọvanọ, ndị sịnetọ, ndị omeiwu nakwa ndị ụlọomeiwu si mpaghara dị iche iche.

BBC ji ozi si n'ọbaozi ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka bụ Independent Electoral and Boundaries Commission (IEBC) egosipụta mpụtara ntuliaka ọkwa onyeisiala a.

Dịka ụlọọrụ a na-agbaso usoro nyocha, e nwereike inwe ihe igbu oge n'etu BBC si ewepụta ozi a.

Dịka iwu mba Kenya siri dị, ọ bụ ulọọrụ IEBC ga-akpọpụta mpụtara ikpeazụ nke ntuliaka ọkwa onyeisiala a.

Mpụtara ntuliaka ọkwa Onyeisiala si kwụrụ

Etu mpụtara ntuliaka Onyeisiala sị dị na mpaghara (counties) dị iche iche

Etu ndị ji ọkwa Sịnetọ si kwuru n'aha pati

Etu ndị ụlọomeiwu si kwụrụ n'aha pati

Mpụtara ntuliaka ọkwa Gọvanọ